Aha Lionel Messi ga-abụ aha ngwa ahịa

Lionel Messi Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A etuola Lionel Messi ugo onye kachasị agba bọọlụ ugboro 10

Otu ụlọikpe na mpaghara Europe ekpebiela na aha onye egwuregwu bọọlụ bụ Lionel Messi ga-abụ aha ngwa ahịa site ugbua.

Oruola afọ asaa ke mgbe Messi kpere ikpe a n'ụlọ ikpe ka aha mee ka aha ya bụ aha ngwa ahịa.

Mana ụlọọrụ akporọ Massi sị mba, na aha Messi yiri aha nke ha.

Ụlọikpe a kpebiri na Lionel Messi bụ onye ama ama, na aha ya anaghị eme mgbagwoju anya.

Mkpebi a na-abịa ụbọchị ole na ole akwụkwọ ntaakụkọ egwuregwu bọọlụ ndị ala France dere na Messi agafeela Cristiano Ronaldo dịka onye kachasị anata ego.

Ugbua, Messi na anata nde pounds 108 mana Ronaldo na-anata nde pounds 94.

Messi dị afọ 30, enyeela ọkpụ ruru 600 n'ime ọnwa nke garaaga. Ọ bụ onye kachasị nye goolu n'otu Barcelona n'otu egwuregwu mba Argentina.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara