Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwụọ iti aka n'obi

Akụkọ kachasị n'abalị a

Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwọ iti aka n'obi

Image copyright Getty Images

Gọọmentị etiti akwụọla ụgwọ ruru nde naira otu narị iri atọ na ise dịka ụgwọ ịti aka n'obi

Ọ bụ ezinụlọ mmadụ asatọ ahụ egburu na Apo n'ime obodo Abuja n'afọ 2013 ka ha kwụrụ ụgwọ a.

Omeiwu ukwu akpọọla onyeisiala Mohammadụ Buhari

Image copyright @NGRSenate

Ndị omeiwu ukwu akpọọla onyeisiala bụ Mohammadụ Buhari ka ọ za ajụjụ maka ọtụtụ mmadụ ha na-ekwu na ndi ochịehi gburu na Benue steeti.

Chete na ụnyahụ ndị ome iwu nta kpọrọ onyeisi ala maka ị za ajụjụ gbasara ogbugbu mmadụ na steetị a.

Mana Buhari ekwubeghị oge ọ ga-abịa za ajụjụ a.

Mmadụ marị iri anọ apụọla na APGA na APC

Image copyright Getty Images

N'Abia steeti, mmadụ ruru otu narị na iri anọ esiila partyi APGA na APC gawa PDP.

Ha kwuru na ha pụrụ makana mpu na aghughọ akariala n'otu ndọrọndọrọ ochịchị ahụ.

Anthony Joshuanaghị anabata aka mgba Deontay Wilder ugbua

Image copyright Getty Images

Anthony Joshua ekwuola na ya anaghị anabata aka mgba Deontay Wilder maọbụrụ na ya hụbeghị ego ahụ ruru nde dolla iri ise.

Cheta na Deontay Wilder wepụtara ego a iji maa Joshua aka ọkpọ.

Na bọọlụ

Arsenal na Atletico Madrid ga-asọ mpi n'iko Europa League

Marseille na FC Red Bull ga-asọ kwa mpi n'iko asọmpị iko a

Gere akụkọ mere n'abalị a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Akụkọ ndị mere taa..