Atiku: Ndị ntoroọbịa ga-eso n'isi ọchịchị m
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Atiku: Onye ga-abụ osote ya?

Peter Obi na Okonjo-Iweala Image copyright Getty Images

Ụfọdụ ndị mmadụ na-eche ka Atiku kpọpụta aha onye ya na ya ga-azọ oche onyeisiala Naịjirịa na afọ 2019.

O nwere ndị chere na ọ ga-adị mma ma ọ kpọ Ngozi Okonjo-Iweala n'ihi ụdịrị nwaanyị ọ bụ.

Ndị ọzọ na-ekwu kwa na ọ ga-abụ Peter Obi bụ aka chịburu Anambra steeti n'oge gara aga.

Mana rue ugbua, onwebeghi onye Atiku kpọrọ aha.

Mgbe BBC Focus on Afrịca gbara Atiku Abubakar ajụjụ ọnụ, ihe mere obi ji sie ya ike ị pụta ịzọ ọchịchị nke ụgboro anọ.

Atiku Abubakar kwuru na nke bụ mbụ o nwere okwukwe na ọ dị njikere ịzọ ọchịchị, kwuo na ọ bụ onye mbụ pụtara iji aha pati PDP zọọ ọchịchị.

Ajụrụ ya ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ onyeisiala Naịjirịa.

Atiku kwuru na ọ ga ahazịgharị ọchịchị naịjirịa, mee ka Steeti ọbụla nwere ọnwe ha.

O kwukwara na ndị ntọroọbịa dị pecent iri anọ ga-eso n'isi ọchịchị ya, maka na ọ na-aghọta ndị ntoroọbịa.

Akụkọ ga-amasị gị: