Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Kwụsịnụ ịchị ehi agagharị - Gọọmentị

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

Gọọmenti etiti egbochiela ịchịgharị ehi malite na Steeti ise

Ndị isi ọchịchị bụ National Economic Council ekwerikọtala igbochi njem ndị na-achị ehi nke ga-amalite na steeti ise dịka Benue, Taraba, Adamawa, Kaduna na Plateau.

Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi kwupụtara nke a na ngwụcha mkparịta ha nwere n'Abụja ụnyaahụ.

Ipob akatọọla gọọmenti etiti banyere Osita Chidoka na Enyinnaya Abaribe

Nkọwa foto,

Ipob na Massob bụ otu abụọ chọrọ nwereonwe Biafra

Otu Ipob agwala gọọmentị etiti ka ha kwụsị ịchụgharị onye bụbu Mịnịsta ụgbọelu bụ Osita Chidoka na Sịnetọ Enyinnaya Abaribe maka itinye aka n'akwụkwọ nnapụta Nnamdị Kanu.

Nke a dị n'ozi Onye ode akwụkwọ otu a bụ Emma Powerful wepụtara ụnyaahụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Kim Jung-un mba Nọt Korịa agala Saụt Korịa

Onyeisiala mba Nọt Korịa bụ Kim Jong-un abụrụla onye ndu ndị Nọt Korịa mbụ ga-amanye ụkwụ na mba Saụt Korịa kamghe alụchara agha Korịa n'afọ 1953.

Kim Jong-un gafere ebe ya ogbo ya nke Saụt Korịa bụ Moon Jae-in kwere n'aka ma zọpụ njem mkparịta ụka.

N'egwuregwu

NFF na Gọọmenti Rivers Steeti ekwuola na ndị Supa Igụls ga-ele ndị DR Congo ọbịa n'asọmpi enyi na enyi na Portharcourt n'ime ọnwa ọzọ

N'ọzọ, Arsenal na Atletico Madrid nyeritara onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ n'asọmpị Uefa Europa ha gbara ụnyaahụ.

Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịko taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ọrịa kansa abụghị ikpe ọnwụ

Aha onyonyo,

Onye meriri ọrịa kansa