Portharcourt: Anyị anaghị ekuruzi ume ndụ

Anwụrụọkụ ojii Image copyright Getty Images

Gọọmentị etiti kwuru na ha achọpụtala ebe 11 anwụrụọkụ ojii nke na-ekochi obodo Portharcourt siri na-apụta.

Ọ bụ Mịnịsta ọdịnaala na-ahụ maka ebe obibi bụ Ibrahim Usman Jibril kwupụtara nke a ụnyaahụ na Portharcourt mgbe.

O kwuru nkea mgbe ya na ụlọọrụ National Environmental Standards and Regulations Enforcement Agency (NESEREA).

O kwuru na gọọmenti na ụlọọrụ ndị ọzọ ga-ejikọta aka ọnụ gbaa mbọ igbochi oke anwụrụọkụ ojii ahụ.

Jibril akpọghị aha ebe iri na otu ahụ anwụrụọkụ ndị sị na-apụta.

BBC Igbo gbara mbọ innweta ndị ụlọọrụ NESEREA na kọmishịọna na-ahụ maka gburugburu obodo onweghị onye zara.

N'ime ihe ruru afọ ise ugbua, ndị bi na Portharcourt nọ zi n'ụjọ ahụike ha maka anwụrụọkụ ojii a.

BBC Igbo gbara otu nwaanyị na-azụ ahịa na Portharcourt akpọrọ Mercy Ekwu Nkuma ajụjụ ọnụ n'ekwentị.

Image copyright Getty Images

O kwuru na anwụrụokụ ojii ahụ sị n'ọdọ ebe a na-esi mmanụ akpọrọ 'kpofire'.

Mercy kwuru na anwụrụọkụ ojii a ekogbuola ha, na ndị bi na Portharcourt a naghị ekuzi ume ndụ.

Mercy rịọrọ ka gọọmentị etiti gbatara ha ọsọ enyemaka tupu ngwa ngwa.

Gere ihe o kwuru ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnwụrụọkụ ojii ekogbuola anyị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a