Ọtụtụ mmadụ apụtaghị nyocha maka ịkpọghachi Dino Melaye

Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa nke a na-akpọ Independent National Electoral Commision (INEC) n'aha ịchafụ eforola ntutu taa na ha ga-aganihu n'usoro nkpọghachi Dino Melaye agabanyeghi na onye omeiwu ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ.

Dịka INEC si kwuo n'oge mbụ, usoro nyocha ndị binyere aka n'akwụkwọ maka mkpọghachi ya bụ onye omeiwu bidoro taa.

Nyocha ahụ bụ maka ndị Kogi sentraal bụ ebe Melaye na-anọchị.

Ndị INEC gosiri nyocha ahụ ha na-eme n'akara twitter ha.

Ọtụtụ ndị deburu akwụkwọ degara INEC n'afọ 2017 ka akpọghachi Dino dịka onye nnọchi anya mana usoro ahụ kpụrụ ukwu n'ala maka akwụkwọ dị icheiche a gbara n'ụlọikpe nke ruru ụlọikpe ukwu.

Mana ụlọikpe ukwuu enyebeghi ikpe ya gbasara okwu ahụ nke Melaye gbara akwụkwọ ka ha kwụsị INEC kpọghachi ya.

Agbanyeghi na ndị ụlọikpe ukwuu ekpebibeghi ikpe ahụ, INEC gara n'ihu n'usoro nkpọghachi Melaye.

Onye na-ahụ maka ikuzi maka ntuliaka n'ụlọọrụ Inec na Kogi steeti bụ Ahmed Bagudu Biambo gwara BBC Igbo na ya bụ usoro nyocha ahụ ebidola taa.

O kọwara na nyocha ahụ gbasara binyerela aka ha n'akwụkwọ iji kpọghachite Melaye.

N'okwu ya: "Ndị ọrụ anyị nọ n'ebe a nha-eme ntuliaka 552 na Kogi sentraal nime 560 ebe a na-eme ntuliaka n'oge ahụ"

"Ndị na-ebinyeghi aka enweghi ihe gbasara ha ịbịa ebe ahụ, naanị ndị binyere aka bụ ndị kwesiri ịbịa."

Biambo kọwara na ndị binyere aka ga-eweta kaadị ntuliaka aka iji gosi na ọ bụ ha binyere aka nakwa na ha tozuru etozu ibinye aka.

Ụfọdụ ndị mmaọ̄ụ ekwuola na e nwere mmerụaka dị na ya bụ usoro mana Biambo kọwara na ndị na-anọchite anya ndị gbara akwụkwọ mkpọghachite na ndị agbara akwụkwọ nọ ebe niile a na-eme nyocha ahụ ihụ na a na-eme ihe ziri ezi.

Cheta na Dino Melaye ka nọ n'ụlọọgwụ dịka o meruru ahụ oge ndị uweojii chọrọ ịkpọrọ ya gaa Lokoja ụbọchị Wednezde.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: