Akụkọ kachasị taa: Inec na-enyocha ndị chọrọ ịkpọghachi Melaye
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Inec na-eme nyocha na Kogi sentraal
Ndị Inec etinyekwuola na nsogbu Dino Melaye ma wuchie Kogi sentraal ime nyocha maka ịkpọghachi Dino Melaye
Ebe foto si, Inec/ Twitter
Nke a bụ usoro so na ikpọghachiete onye omeiwu ahụ dịka sinetọ na-anọchite ndị Kogi sentraal n'ụlọ omeiwu sineti.
Melaye ka nọ n'ụlọọgwụ n'Abuja maka ahụ o meruru ebe ndị uweojii kpọ ya aga Lokoja n'izu gara aga.
Ọrụ adịghị ụbọchị Tuzde abala 1 ọnwa Mee
Ebe foto si, NLC
Gọọmenti etiti ekwuola na ọrụ adịghị ụbọchị Tuzde abalị mbụ ọnwa Mee maka mmemme ncheta ndị ọrụ.
Mịnịsta okwu ime obodo dị n'aka bụ onye Abdulrahman Dambazau kwuru nke a n'akwụkwọ o dere ụnyaahụ.
Mba Amerịka ekelela Sawụtụ na Nọt Koria
Ebe foto si, Getty Images
Ọchịchị Trump enwerela ọtụtụ nhazịgharị ndị mba ọzọ sị abata Amerịka kemgbe ọ rigoro n'ọkwa dịka onnyeisiala
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agwala onyeisiala mba Sawụtụ Koriya bụ Moon Jae-in ka ọ na-adị nkwadebe maka nzuko ha abụọ dịka a na-akwadebe ebe ha ga-anọ mee ya.
Nke a na-eso nzuko Nọt na Sawụtụ Koriya mere ụnyaahụ bụ nke gara nkeọma ebe Nọt na Sawụtụ kwetere ibi agha dị n'etiti ha abụọ.
Na egwuregwu, Liverpool na Stoke City gbara 0-0
Ebe foto si, Liverpool FC? Twitter
A chụọla Diego Maradona n'ọrụ dịka onye nkuzi otu egwu bọọlụ Al Fujairah ebe ọ na-ebulighi otu ahụ n'ogogo nke mbụ site n'ogo ha nọ ugbua.
Otu egwu bọọlụ Liverpol na Stoke City gbara onwe ha onye laba onye laba n'asọmpi Premia Lig taa dịka ndị Stoke City na-azọ ka a ghara ịchụla ha.
Nkeji nke mgbede a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo nke taa
A maghị m na Igwe Tupac ga-achake etu a