Ụlọikpe anapụla Ugwuonye ikike ịbụ ọkaiwụ

Image copyright Uche Akolisa
Nkenke aha onyonyo Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile

Ụlọikpe ọkachasị nọrọ n'Abụja wepụrụ aha onye ọkaiwu bụ Emeka Ephraim Ugwuonye, n'akwụkwọ ndị ọkaiwu ala Naijiria.

Ụlọikpe ọkachasị kwụpụtara mkpebi ahụ n'akwụkwọ ozi ha degara Ugwuonye, n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Eprelu nke Gertrude B. Bari-Nyana Esq tinyere aka na ya n'aha onyeisi ụlọikpe.

Otu nwaada aha ya bụ Victoria Ekweani dere akwụkwọ mkpesa iji kwuo na ya kpọrọ Ugwuonye ka ọ nọchịte anya ya n'okwu gbasara akụ nwanne ya nwaanyị nwụrụ anwụ bụ Ifeoma Ekweani. Mana ọkaiwu ahụ emeghị ihe ya gwara ya kama o tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe, Enugu State Probate Registry, iji nata ikike dịka onye chọrọ ịnwụ nwata nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ iji nweta ama bụrụkwa onye o ji ụgwọ iji nweta akụ ya.

Dịka ụlọakwụkwọ Thisday si dee, akwụkwọ ozi ahụ sị, "Nke a bụ iji mee ka o wee gị anya na ozi kọmiti ndị ọkaiwu lebara anya n'okwu ahụ nke kwuru ka ewepụ aha gị n'akwụkwọ ndị ọkaiwu, ka ekpechara gị ikpe ma chọpụhta na ikpe mara gị n'ihi arụ ịkpara n'ọrụ gị dịka onye ọkaiwu nke megidere iwu ji ndị ọkaiwu ala anyị.

"Dịka e nweghị onye gbaghara akwụkwọ ozi ahụ nke ha dere n'ụbọchị 22 nke ọnwa Mee ,afọ 2017 tupua ohere e nyere maka nke a gafere , A na -akagbụ aha,Ugwuonye Ephraim Chukwuemeka, n'akwụkwọ ndị ọkaiwụ.

"Ugwuonye Ephraim Chukwuemeka enwekwaghị ikike ịrụ ọrụ dịka ọkaiwu nke ụlọikpe ọkachasị nke Naijirịa. A kagbuola akwụkwọ ọbụla e nyeburu gị dịka onye ọkaiwu ugbua ugbua."

Otu na-ahụ maka ịnabata ndị gụrụ iwu n'ọrụ dịka ọkaiwu nyochabụrụ okwụ ahụ ma maa Ugwuonye ikpe. Ha nyekwara onyeisi ụlọikpe ozi ka o wepụ aha Emeka Ephraim Ugwuonye n'akwụkwọ ma zigara ya ozi ị gwa ya ihe ha mere.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a