Nọt Koria kwuru na ha ga-emechi ụlọọrụ ngwaagha nuklịa na Mee

Ụlọọrụ Punggye-ri dị na Nọt Koria Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ebe a na-emepụta ngwaagha nuklia dị na Punggye-ri Nọt Koria dịka foto e siri n'igwe see n'afọ 2013 siri gosi ya

Ụlọọrụ onyesisiala Not Koria ekwuola na ha ga-emechi ebe ha na-emepụta ngwaagha nuklia dị na Punggye-ri na mba ahụ n'ọnwa Mee.

Punggye-ri nke dị na ugwu mba Not Koria bụ ebe kachasị n'ebe ndị mba ahụ hiwere maka mmepụta ngwaagha nuklia.

Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị mba ahụ bụ Yoon Young-Chan kwuru na a ga-emechi ụlọọrụ ahụ n'ihu ọha mmadụ nakwa ndị ọkacharamara n'ihe gbasara ngwaagha nuklia ndị mba Saụt Koria na mba Amerịka ndị ha ga-akpọ oku ka ha bịa hụ ka o si mee.

Young-Chan sịrị na onyeisiala Nọt Koria bụ Kim Jong-un kwuru na ya "ga-emechi ọdọ ngwagha nuklia n'ọnwa Mee".

Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisiala Nọt Korịa kwụkwara na ya "ga-akpọ ndị ọkachamara si Saụt Koria na US oku ka ha bịa gba aka ebe ka ihe a siri gaa, iji gosi mba ụwa na ọ bụ ihe ha kwuru ka ha na-eme".

Ndị sayentistị kwuru na ụlọọrụ ahụ adakpọwala kemgbe ọnwa Septemba.

N'ụbọchị Fraide, onyeisiala Nọt Koria na ogbo ya nke Saụt Koria kwekọrịtara ikpochapụ ngwaagha nuklia na mpaghara ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara