Akụkọ kachasi n'abalị a: Ngagharịiwe CAN ga-aga n'ihu na Naijiria niile

Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụtụtụ a:

Image copyright Canng.org/AFP

Dịka otu jịkọrọ ndị otu Kraist a kpọrọ CAN n'aha ịchafụ na-ekwusi ike njikere ha dị ime ngagharịiwe na Naijiria niile maka oke ogbugbu mmadụ ndị ọchịehi meere na Benue steeti,

ndị omekome buu egbe wakporo obodo Birnin Gwarị na Kaduna steeti ụnyaahụ ma gbuo ihe karịrị mmadụ 10, merụọ ịrị atọ ahụ,tọrọ ụfọdụ mmadụ ma gbakwa ọtụtụ ụlọ ọkụ.

Na mba ofesi

Mba Nọt Koria ekwela nkwa na ha ga-emechi ụlọọrụ ebe ha na-enyocha usoro ngwa agha nuklia.

Kim Jong Un bụ onyeisiala ha kwuru nke a. Ọ kpọkwara ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nuklia nke ndị mba Amerịka oku ha bịa jiri anya ha hụrụ ya n'ọnwa Mee

N'egwuregwu

Image copyright @thenff

A kagbuola asọmpị kwesiri ịdị n'etiti otụ bọọlụ Naịjirịa nke obere bụ Flying Eagles na ibe ha nke ndị Bene Ripọblik.

Ebidoghị nkwado asọmpị a n'oge bụ ihe kpatara e ji kagbue ya.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ ụtụtụ a na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionA maghị m na Igwe Tupac ga-achake etu a