Akụkọ kachasị n'abalị: Onye turu ogbunigwe be Nnia Nwodo?
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Onye turu ogbunigwe be Nwodo?
Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017
Ka anyị bido n'Enugwu ebe e kwuru na a turu ogbunigwe na be onyeisi ndị ohanaze Ndigbo bụ Nnia Nwodo dị n'Ukehe taa.
Ndị uweojii kwuru na ọdachi a mere n'ezie, ma mebie obere ihe mana amatabeghi ndị mere ya bụ ihe.
Otu ndị ụka niile bụ CAN ebidola ngagharị iwe
Ebe foto si, Getty Images
Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa
Otu jikoro ndị na-ekpe ụka Kraịst na Naịjirịa a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) na bekee na-eme ngagharị iwe taa maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa na ọtụtụ ndị mmadụ e gburu na Benue steeti na steeti ndị ọzọ na mpaghara ugwu Awụsa.
Cheta na CAN kwuru n'ụbọchị Fraide garaaga na ha ga-eme ngagharị iwe ahụ taa bụ ubọchị uka n'ụlọụka niile n'ala Naịjirịa.
Ngagharị iwe a bu maka ndị ụkọchukwu abụọ na mmadụ iri na isi ndị ọzọ ndị ọchịehi jiri egbe gbuo na Benue steeti ụbọchị 25 ọnwa Epureel.
Dino Melaye bụ a kwaa akwụrụ
Ebe foto si, Getty Images
Dino Melaye na gọvanọ Kogi steeti were nnukwu esemokwu
Nke a bụ maka na nkata ịkpọghachi ya site n'ụlọomeiwu sineti akpụọla afọ n'ala dịka e nwetaghị mmadụ ole iwu ntuliaka kwuru tinyere aka n'akwụkwọ ahụ.
Melaye si n'akwa ya n'ụlọọgwụ kele ndị mpaghara Kogi-West ọ na-anọchite maka nke a.
Onyeisiala Muhammadu Buhari awuchiela Washington DC
Onyeisiala Muhammadu Buhari eruola Washiton dị n'Amerịka taa maka ọgbakọ ya na Donald Trump nwere echi.
N'egwuregwu
Ebe foto si, PA
Man City gbara ndị West Ham ọkpụ anọ a satara otu n'asọmpi Premia Lig taa.
Machester United gbakwara ndị Arsenal ọkpụ goolu abụọ a satara otu.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo taa
Nwaanyị meriri ọrịa kansa, lee etu o si mee ya.
Onye meriri ọrịa kansa