Ipob: Aka anyị adịghị n'ogbunigwe agbara n'ụlọ Nwodo

Ipob Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ahụbeghị onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu, kamgbe ọnwa Sepụtemba afọ 2017 ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya.

Otu Ipob akatọọla mwakpo mere n'ụlọ onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo, ma kwuo na ọ bụ aka ọrụ ndị na-eyi ndụ egwu.

Otu a kwuru na aka ha adịghị na mwakpo ahụ dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ ha aka banyere ọdachị mere n'ụlọ Nwodo ma sị na ndị chọrọ ka ha daa, ga-ebu ụzọ daa.

N'ụbọchị ụka, n'Ukehe dị n'Enugwu steeti, a turu ogbunigwe na be onyeisi ndị Ọhaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo nke mebiri obere ihe, mana amatabeghị ndị mere ya bụ ihe.

N'ozi onye odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Emma Powerful wepụtara o kwuru sị, "Ipob katọrọ mwakpo ndị na-eyi ndụ egwu n'ụdịrị ndị Fulani na-achị ehi mere n'ụlọ Nnia Nwodo.

Image copyright Enugu STate Police / Twitter

"Anyị na-akpọku ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ na ọdịda ka ha dị njikere ma mụrụkwa anya maka ndị Fulanị na-achị ehi abatala n'obodo".

"Ipob n'ụwa niile anụla akụkọ na-agagharị na soshal midia na ndị Fulani na-eyi ndụ egwu ga-awakpo ụlọ ndị uweojii na gọọmentị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

"Ha ga-eboya ndị Ipob dịka onyeisiala Buhari nọ na mba Amerịka ugbua iji kpọọ Ipob otu na-eyi ndụ egwu ma gbochie anyị ime ngagharị iwe na mba Amerịka megide Buhari."

O kwuru na nkata ọjọọ ndị a na-akpara otu Ipob amaala afọ n'ala dịka Ipob bụ otu na-egosipụta iwe ha n'ụwa niile site n'ụzọ ziri ezi.

N'oge gara aga, Nnia Nwodo katọọrọ ụzọ ndị Ipob ji na-achụso mwereonwe Biafra kwuo na "ọ bụghị site n'ịlụ ọgụ"

Nke a mere Emma Powerful jiri zaghachị ya ma kwuo na Nnia Nwaodo so na ndị mere ndị agha Naịjirịa jiri wakpoo ụlọ Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob.

Gere ihe o kwuru ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIpob: Ngagharị iwe anyị bụ i gosi mba Amerịka mmegbu a na-eme anyị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a