Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ihe ọgwụ ike codeine na-eme ndị ntoroọbịa

Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a

Nkenke aha onyonyo Ọgwụ ụkwara codeine emela ọtụtụ ndị ntorobịa isi mgbaka

Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Nigeria bụ Emzor achụọla otu onye oreeahịa ha ma kwụsị mmadụ abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara,codeine, n'ụzọ megidere iwu.

BBC malitela ụbọchị Tuusde ngosi ihe onyonyo ha mepụtara nke na-egosi mkpamkpa iṅụbiga ọgwụ ụkwara codeine oke na-eme na ndụ ndị ntoroọbịa.

A malitere ihe ngosi a na Sheraton Hotel Ikeja, Legos, ụnyaahụ dịka ozi na-ekwu na achụọla onyeisi azụmahịa ụlọọrụ Emzor Pharmaceutical ndị aka na-arụ n'akụkọ ahụ.

N'akụkọ ọzọ...

Image copyright NLC Blog
Nkenke aha onyonyo Ndịọrụ chọrọ ụgwọọrụ opekatampe ọhụrụ

Dika taa bụ ụbọchị ncheta ndịọrụ bekee n'ala Naịjiria, onyeisi ndị Nigeria Labour Congress NLC bụ Ayuba Wabba, ekwuola na ha agaghị ekwe ka kọmitii ahụ ehibere maka ileba anya n'ụgwọọrụ opekatampe ndị ọrụ bekee dọghachị aka elekere azụ n'imejupụta nkwa ahụ.

Wabba kwuru nke a n'emume ha kpokobara ndị ọrụ na Abuja ụnyaahụ.

Na mba ndị ọzọ:

Image copyright Getty Images

Ndị United Kingdom akwadola amụma nke ndị Iran n'agbanyeghị na US na Isreal hụrụ aka enwe na ya bụ ofe.

Israel mere ihe ngosi iji kwuo na Iran ji ụzọ aghụghọ etinye aka n'ịrụputa ogbunigwe nuklea nke ndị Iran na-agọ.

Gee nkeji nke mgbede a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCodeine, ọtọmegbum