Lee ndị uweojii aka ha kacha kwụrụ ọtọ na Naịjirịa, otu bụ onye Igbo

Mazị Ken Nwosu na Adekunle Rufus Adedeji
Nkenke aha onyonyo Mazị Ken Nwosu na Adekunle Rufus Adedeji anaghị ana aka azụ ka ha na-arụ ọrụ ha

Ị gaa n'ọtụtụ ụlọọrụ ndị uweojii ị ga-ahụ ka e dere 'ndị uweojii bụ enyi gị', mana ọ rara ahụ ịhụ onye Naịjirịa nwere ntụkwasị obi n'elu ndị uweojii.

N'afọ 2017, otu ndị International Police Association na otu Institute for Economics and Peace kwuru na otu ndị uweojii Naịjirịa bụ nke 'kachasị njọ' n'ọrụ uweojii mbaụwa niile.

Nkwuputa a so mee ka ọtụtụ ndị Naịjirịa kwudosịa ike n'okwukwe ha na ndị uweojii Naịjirịa anaghị arụ ọrụ nchekwa edinyere ha.

Mana ndị uweojii abụọ na-agbanwe ebumnuche ndị mmadụ banyere ndị uweojii na Naịjirịa.

Maazị Ken Nwosu na Adekunle Rufus Adedeji nwetara ihe nrite maka ịbụ 'ndị uweojii aka ha kachasị kwụrụ ọtọ' na Naịjirịa.

Ndị otu na-ahụ maka oke ruru onye bụ Constitutional Rights Awareness and Liberty Initiative (CRALI) na ndị US Consulate dị na Naịjirịa jikọtara aka ọnụ wee nye ha ihe nrite a.

Dịka ndị CRALI si kwuo, ha chọrọ ma jụọ ndị mmadụ maka ndị uweojii aka ha kwụ ọtọ na Naịjirịa niile wee họpụta mmadụ ruru 22, ebe ha si họpụta Adedeji na Nwosu dịka ndị kachasị mma.

Adedeji bụ Superintendent na-ahụ maka otu Criminal Investigative Bureau nke Ekiti Steeti ebe Nwosu bụ Divisional Police Officer ọhụrụ nke ndị Kwani divisional headquarters dị na Sokoto Steeti.

Image copyright Ken Nwosu Facebook
Nkenke aha onyonyo Ken Nwosu arụọla n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja nakwa Lagos na Akwa Ibom

Adedeji gwara BBC na onwere etu o si eme ya n'ahụ ma ndị Naịjirịa na-ekwu okwu ọjọọ maka ndị uweojii, maka na ọ bụghị ha niile na-eme ihe ọjọọ.

O kwuru "Ọ bụ eziokwu na enwere ndị uweojii ọjọọ, mana etu ụfọdụ si akpa agwa bụ maka etu e si zụọ ha n'ụlọ. Ọ bụ ihe na-eme n'obodo na-egosi n'etiti ndị uweojii."

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a