Ogbunigwe egbuola mmadụ 28 na Mubi

Obodo Konduga Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ogbunigwe so na ihe ndị Boko Haram jị ebuso Naịjirịa agha

Ndị uweojii na Adamawa steeti na-ekwu na ogbunigwe gbara na Mubi gburu mmadụ 28 ma merukwa ndị ruru 50 ahu.

Ogbunigwe agbala na obodo Mubi bu obodo dị na Adamawa steeti nke ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Awụsa na Naịjirịa.

Otu n'ime ogbunigwe a gbara n'ime ụlọ ekpere ndị alakụba.

Ndi hụrụ mgbe ihe a mere na-akọwa na ọ ndị omekome abụọ kpara ike a. Otu gbara ogbunigwe ya n'ime be ndị alakụba na ekpe ekpere mgbe ha na-akwado ibido ekpere. Ka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ nke izizi ahu, onye ọzọ gbapụkwara nke ya na ezi.

N'ọnwa Nọvemba n'afọ gara aga ihe kariri mmadụ 50 mgbe Boko Haram gbara ogbunigwe n'ime ụlọ ekpere na Mubi.

Ndị omeiwu ukwu si ka ndị gọọmentị mepe ọdọ ndị agha na Mubi.

Onwebeghi ndi kwuru na ọ bụ ha kpara ike a, mana ndị Boko Haram bu ndi ama maka iji ogbunigwe gbuo ọtụtụ mmadụ na ọwụwa anyanwụ nke ugwu awụsa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara