Ọba Rilwan na ndị eze Yoruba chọrọ ka Buhari chia na 2019

Mohammdu Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mohammdu Buhari na onyeisi ala Amerika Donald Trump enweela ọgbakọ

Eze na-achị Legos steeti aha bụ Rilwan Akiolu na-arịọ ndị Naịjirịa ka ha nyere Buhari efe ị chị Naịjirịa ọzọ mgbe afọ 2019 ga-eru.

Rilwan kwuru na ọchịchị Buhari ka nke Olusegun Obasanjo dịmma. O kwukwara na ọchịchị nke Goodluck Jonathan kara ịka mma maọbụghị ndị ya na ha rụrụ ọrụ.

N'ọnụ okwu ya, "Buhari kwesiri ị me ọtụtụ ihe, ekwetara m na nke a, mana anyị kwesiri ị kwado ya ka ọ rụcha ọrụ ya niile n'afọ anọ ọzọ. Ka anyị hụrụ ebe ọ ga eduga akanaụba ala Naịjirịa"

Eze ọzọ na-akwado Buhari bụ eze nke obodo Egba aha ya bụ Adedotun Gbadebo, o kwuru na Naịjirịa kwesiri ị kwado Buhari makana o nwere ọtụtụ ọrụ o kwesiri ị rụcha arụcha.

Ndị eze ọzọ dịka eze na-achị obodo Ife aha ya bụ Enitan Adeyeye Ogunwusi na eze ndị obodo Bini aha ya bụ Ewuare Ogidigan ekwubeghi ugbua ma ha ga-akwado Buhari na ebumnuche ya ịchị Naịjirịa ọzọ.

Mana ọnụ na-ekwuchiri otu Afenifere bụ Yinka Odumakin, ekwuola na ọbụrụ na Mohammadu Buhari etinyebeghi ọnụ na nhaziri Naịjirịa na mpaghara na mpaghara otu ha anaghị atụkwasị obi na Buhari maọbụ kwado ya na ebumnauche ya ịchị Naịjirịa ọzọ.

Onye mụpụtara otu Oodua Peoples Congress bụ Fredrick Fasehun ezoghi okwu ọnụ nke ya.

O kwuru na Buhari ekwesighị ịchị Naịjirịa ọzọ makana ala emebiela.

Fasehun kwuru na onweghị onyeọbụla hụrụ nkwa niile Buhari kwere oge ọ na-agba ọsọ ịchị Naịjirịa na 2015.

Akụkọ ndị ga-amasị gị