N'Enugwu, ụbọchị ndị ọrụ kpọtụrụ akpọtụ

Ndị ọru Enugwu steeti Image copyright @BBC
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Naịjirịa na-arịọ gọọmentị ka ha tinyere ha ego n'ụgwọ ọnwa ha

Ndịọrụ n' Enugwu steetị sonyere ndị ogbo ha na ụwa nile wee mee mmemme ụbọchị ndị ọrụ na Tuusde.

N'ogige ezumezu bụ Okpara Square Enugwu ka ndị ọrụ karịrị puku atọ zụkọrọ wee kwụọ na ahịri na ahịrị.

Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyị Ugwuanyi bụ onye naara mgbucha na oge emume ahụ gwara ndị ọrụ na ọchịchị ya jisiri ike ịhụ na ụgwọ ọnwa na orubere ha nile bụ ihe a na-akwụ oge ọbụla o kwesiri.

Onyeisi otu jikọrọ ndịọrụ bụ Nigeria Labour Congress n'Enugwu bụ Viginus Nwobodo kelere Ugwuanyị ka osi na-akwụ ndịọrụ n'Enugwu steeti ụgwọ n'ụbọchị ịrị na atọ na ọnwa ọbụla. Nwobodo gwara Ugwuanyi ka ocheta wee kwụtọpụ ndị ọrụ onwa ịrị na atọ okwere ha na nkwa n'afọ gara aga.

Image copyright @BBC
Nkenke aha onyonyo Gọọmentị ekweela nkwa n'ụgwọ ọnwa ga-arị elu mgbe adịghị anya

Igbokwe Chukwuma bụ onyeisi Trade Union Congress toro gọọmenti Enugwu maka ịmapụta otu narị nde naịra ịji wee kwụọ ndị lara n'ọrụ orubere ha niile.

Igbokwe yọkwara Ugwuanyi ka onye ntuziaka ka ndị na-akwụ ụgwọ ọnwa na-akwụ mịnịstrị na parastatalụ ụgwọ na otu ụbọchi ka ọṅụ ndịọrụ oyibo wee zuo oke. Otutu ndị ọrụ ahu mere mmemme ikwu na ahịrị zọọ ije dịka ndịagha kwuru na nani ihe ha chọrọ bụ ka gọọmentị etiti bunikwuo ụgwọ opekata mpe nke ndịọrụ a na-akpọ minimum wage na olu bekee.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a