Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Awakpola onye ogbu opi na Ethiopia

Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Gọọmentị Naịjirịa machiri ị tụbata Codeine taa.

Okoloto mba Ethiopia

Ebe foto si, Getty Images

Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike enyela iwu ka NAFDAC bụ ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naijiria machie inye ikike ịtụbata codeine na Naijiria maka ime ọgwụ ụkwara.

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Ịsaac Adewole meere ka amata nkea n'ụlọọrụ n'abụja n'ụbọchị Tuusde.

N'ebe ọzọ...

Eserese ebe ogbunigwe gbara

Akụkọ na-eru anyi nti na akọwa na ihe ruru mmadụ iri abụọ n'aọ anwụọla na obodo Mubi dị na Adamawa steeti ebe ogbunigwe abụọ gbara ebe ahụ.

Anya hụrụ ya na-akọwa na ọ gbara ka ndị ụka alakụba na-akwado ị ga ekpere nke ehihie.

Na Legos

Ọgba aghara ndị emume Legos

Ụfọdụ mmadụ emerụọla ahụ na Legos ebe emume iji cheta ụbọchị ndị ọrụ ghọrọ ọgbaghara.

Ndi otu ngalaba n'achịkọta ndị ọrụ ụgbọala bụ NURTW n'aha ịchafụ bụ ndị a tụrụ aka n'aha bidoro nsogbu a.

N'egwuregwu

Okoloto mba Ethiopia

Ebe foto si, Getty Images

Otu bọọlụ Welwalo adigrat na mba Ethiopia awakpoola onye ogbu opi na asọmpị ha na-agba.

Ọ bụ ekweteghị n'ihe ogbu opi ahụ kwuru kpatara nke a ebe ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'ala ha chụrụ ha na ndị nkuzi ha n'ọrụ n'ike.

Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma:

BBC Igbo gara emume a na-akpọ GTFood and Drink fair na Legos taa.

Lee ụfọdụ foto anyị sere ebe ahụ:

Azụ nkpọ

Ebe foto si, BBC Sport

Akwụ
Nwa-ada Igbo ji 'jioji' eme ngala.

Gee nkeji nke mgbede a ebe a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa:

Aha onyonyo,

Ofalla ala Igbo