Akụkọ kachasị n'abalị: Chukwu ga-ekpe ndị chịrị Naịjirịa ikpe
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ka Chukwu kpee ndị chịburu na-achịaghị nke ọma ikpe - Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na Chukwu ga-ekpe ndị niile chịburu Naịjirịa na-achịtaghị nke ọma ikpe.
O kwukwara na ndị ntorobịa na mpaghara ugwu Awụsa agaghị akwụkwọ maọbụ hapụrụ ụlọakwụkwọ
Buhari siịna ya etinyela aka n'akwụkwọ maka iwe ndị uweojii puku isii n'ọrụ iji tinye uchu n'okwu nchekwa Naijiria.
Rochas si ka ewelie ndị ọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha enyela iwu ka e bugoo ndịọrụ steeti ahụ n'ogogo ọhụrụ.
Okorocha kwuru nke a na mmemme ncheta ndị ọrụ e mere ụnyaahụ.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Dibịa onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ya edeghiri Donald Trump akwụkwọ ahụike o jiri zọọ ọchịchị n'afọ 2016.
Dibia ahụ aha ya bụ Harold Bornstein kwuru na Trump jiri aka ya dere onwe ya akwụkwọ ahụike ahụ.
Kanye West nọ n'akụkọ kwa mgbe ugbua

Ebe foto si, Getty Images
Onye egwu mba Amerịka bụ Kanye West na-abatazi n'akụkọ nnukwu.
O kwuru na ohu ndị ọcha jiri ndị isi ojii mere n'oge gara aga nwereike ịbụ ihe ndị isi ojii ahụ chọrọ.
Nke a bụ otu nime ihe ọ na-ekwugasị ọhụrụ a.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-achị n'asọmpi Champions League bụ otu Real madrid agbapụla Bayern Munich iji wụba n'ọkara ikpeazụ nke asọmpi ahụ.
Ha gbara onwe ha ọkpụ abụọ asaghachiri abụọ mana ndn̄ị Bayern kwesiri imeri ha iji nweta akara ịgbago agba ọkara ikpeazụ ahụ
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo taa
Nwaanyị meriri ọrịa kansa, lee etu o si mee ya.
Ị chere ka a chutuo Buhari?