N'Enugwu ndị uweojii anwụchiela ndị otu ọjọọ

Ndị uweojii Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii n'Enugwu ji ike na ebube achụ ndị otu ọjọọ ọsọ n'Enugwu

Aka ndị uweojii akparala ndị nọ n'otu ọjọọ oge ha chọrọ ịnabata ndị ọhụrụ n'Enugwu.

Ndị uweojii kwuru na ha natara ndị ahụ ụdị egbe dị icheiche ebe ahụ.

Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu kwuru na ha nwuchiri ndị ahụ n'elekere nke mbụ ime abalị ụbọchị Monde n'ọpụpụ Enugwu.

Amarizu kwuru na ngalaba ndị uweojii na-ahụ maka ichụ ndị otu ọjọọ ọsọ nwụchiri ndị ahụ site na nchọpụta ha mere.

O kwuru na mmadụ 25 ha nwụchiri si na mahadum dị icheiche nakwa ụlọakwụkwọ sekọndịrị ndị chọrị ibanye ajọ otu a kpọrọ "Black Axe Ayes Confraternity."

Amarizu kwuru na ndị ha nwụchiri na-enyere ha aka na nyocha dịka o si gbasa ndị ajọ otu.

N'okwu ya; "Ụlọọrụ anyị dị nkwadebe ma kwụrụ chịm na-alụso ndị otu ojoo na ajọ agwa ndị ọzọ dị n'etiti ndị na-eto eto na steeti a."

Gịnị ga-eme ndị ahụ e jidere?

Image copyright Ebere Amaraizu
Nkenke aha onyonyo Ebere Amarizu bụ onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'Enugwu

BBC Igbo gbara Ebere Amaraizu ajụjụọnụ, ọ kọwara na ndị ha jidere bụ ọkachasị na ụmụ na-eto eto.

O kwuru na ha na-eme nyocha nime ihe na-ebuba ụmụ na- eto eto na-ịbanye otu ọjọọ nke o kwuru na ha achọpụtala na uru adịghị na ya.

Amarizu kwuru na ha chọpụtara na ọ bụ ndị ọgbọ ha na-akwanye na amaghị ama nakwa na ha na-achọ nchekwa.

N'okwu ya; "Anyị agbala ha ajụjụọnụ ihe kpatara ha jiri abanye otu ndị a nke ha kwuru na ọ bụ nchekwa bugara ha.

"Ha kwukwara na ndị ọgbọ ha nọ na ya, ya mere ha jiri chee na ọ bụ ihe ndị mma ebe a na-ekwekwa ha nkwa nchekwa.

"Mana ha ahụtala ugbua na o nweghi uru dị na ya maka na nchekwa ha na-achọ, ha enwetaghị ya."

Amarizu kwuru na ụfọdụ nime ndị ahụ bụkwa ndị okenye . O kwuru na otu ọjọọ bụ njọ megide obodo nke ha ka akpọga ha ụlọikpe ma ha mechaa nyocha ha.

N'okwu Amarizu; "Anyị na-eme nyocha, anyị mechaa ya, anyị ga-akpụpụ ha ụlọikpe ebe a ga-ekpe ha ikpe ma nye ha ntaramahụhụ kwesiri ha."

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara