Ụmụaka isii adabala n'ime olulu nsi na Kenya

Ụlo nsị Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo A na-akọwa na ọ bụ miri ozuzo mere ụlọ nsị jiri zee

Akụkọ si Kenya eru anyị ntị na-akọwa na ụmụakwụkwọ isii dabara n'ime ụlọ mposi n'ụtụtụ Wenesde.

Ndị ụlọ ntaakụkọ Citizen TV kwuru na ihe a mere na mpaghara Nakuru county , nke ndị n'ugwu isi obodo Kenya bụ Nairobi.

Ụlọ ntaakụkọ Standard dele na onyeisi nkuzi n'ụlo akwụkwọ Kisulisuli kwuru na ụmụakwụkwọ anọ n'ime ndị a pụtara ma onweghị ihe mere ha , mana abụọ n'ime ha merụrụ ahu.

Onye ntaakụkọ sị ụlọ ntaakụko ọzọ na-ekwu na ọsọ ụmụaka ise ka a kpọpụtara, ka otu ka nọ n'ime onunu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara