Akụkọ kachasị n'abalị a: Igbo latanụ maka ncheta Bịafra - Zionists

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Zionist Movement si ụmụ Biafra lọta ala Igbo

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị otu Biafran Zionists Federation sị na ha ga ebuli ọkọrọtọ Biafra na obi gọọmenti Enugwu steeti ụbọchị 30 Mee

Ndị Otu Zionists movement akpọlaa oku ka ụmụ Biafra nọ n'oru na Igbo lọta na mkpuru ụbọchị IRI ATỌ NKE onwa May.

Ha sị na nnlọtaa ga-enye aka ị me ncheta maka ụbọchị Ojukwu nyere iwu ka Biafra diri.

Ibrahim Idris sị na ya agaghị aza ndị Sineti

Image copyright Nigeria Police/Facebook
Nkenke aha onyonyo Nke bụ ugboro abụọ onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris azaghị oku ndị Sineti kpọrọ ya

Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim IDRIS agbala isiaK wara na ya agaghị aza oku ndị omeiwu ukwu kpọrọ ya.

Ha sị ya bịa kọwa maka ajọ aka ha kpara onye otu ha bụ Dino Melaye mgbe ha jidere ya.

Na mba ofesi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Stephen Hawking chisara ọwara na 14 March 2018

Ọnye ọkamuta lara mmụọ bụ Stephen Hawkings chọpụtara na ụwa a anyị nọ n'ịme ya nwere oyiri.

Akwụkwọ nchọpụta were ya ọgụ afọ pụtara ihe abali 10 tụpụ Hawkings a laa mụọ.

N'egwuregwu

Image copyright Liverpool/twitter
Nkenke aha onyonyo Nwoke aha ya bụ Sean Cox (53) zọrọ ndụ ya azụ site na ihe ndị nkwado Roma kụrụ ya ka agbachara bọlụ ụbọchị Tuzde gara aga

Ndị egwu bọlụ Liverpool a dọla ndị nkwado ha aka na ntị ka ha a nwakwala anwa were ụkwụ gaa maọbụ laa mgbe ha ga abịa ikiri egwu bọlụ nke ha na ndị Roma FC ga -agba na mgbede a.

Ha sị ka onye ọbụla gba mbọ baa ụgbọala maka egwu ndị nwakpo dịka ọ dị n'izu gara aga.

Nkeji nke ụtụtụ a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo taa

Akụkọ ihe mere mgbe ekpuhere "Sweet Codiene" na legos na ịchafụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị bịara ngosi ihe onyonyo BBC mere maka Codeine na ihe ha kwuru

Akụkọ ndị ga-amasị gị