Gbasaanụ ozi kwụọtọ -Buhari

Muhammadu Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari na-ebokarị ndị ọrụ mgbasa ozi Naịjirịa ebubo ozi ụgha

Tata bụ ụbọchị eji echeta ndị ọrụ mgbasa ozi na mbaụwa niile.

Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari jikwa ohere a ekwe ndị ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa nkwa na ọ gaghị na-esonye aka na otu ha sị arụ ọrụ ha.

Buhari yọkwara ha ka ha na-agbasa ozi ziri ezi.

Isiokwu ncheta ndị ọrụ mgbasa ozi na mbaụwa niile nke arọ 2018 bụ "I lebanye anya na mmefusi ikike,ikpe kwuọtọ nakwa nhatanha iwu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị ọrụ mgbasa ozi etufuola ndụ ha ebe ha na-arụ ọrụ ha

O si n'ọnụ onye na-enye ya ndụmọdụ n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Femi Adesina wee na-atụghari uche na isiokwu a.

Buhari kwuru na-ekwesi mkwa ike na ya ga-ahụ na anaghị emegide ndi ọrụ mgbasa ọzi na Naịjirịa ma ha na-arụ ọrụ ha.

N'ọnụ ya ndị ọrụ mgbasa ozi mara amara na anyị ga-edowe okwu anyị,mana anyị chọrọ ka ha gbasa ozi kwụọtọ,gbara ndị mgbasa ozi na-achọ ị bute ọgbaghara n'obodo ọsọ.

Onyeisiala sị na o kwetekwara na ndị mgbasa ozi ziri ezi na-ebute ọganiru n'obodo mana ọ ga-adimma ka ndị ji ya bụ ọrụ ebute ọgbaghara chegharịa.

Ọ dọkwara aka ntị gbasara ntụliaka na-abia na 2019,na-ayọ ka ndị mgbasa ozi gbasa ya n'ụzọ kwụọtọ n'agbanyeghị onye ọbụla so na ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: