Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ngosi akwa ọrịa n'ụlọikpe

Dino Melaye Image copyright Sumner_sambo
Nkenke aha onyonyo Dino si n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ gaa n'ụlọikpe

Ụlọikpe abụrụla ebe ngosi etu ndị ndọrọrndọọ ọchịchị ga-esi kwado bịa maka ikpe ha nakwa ụdị akwa ọrịa ha ga-eji bịa.

Ọ bụụla ihe ngosi na ụfọdụ ndị ndọrọndọọ ọchịchị a na-ekpe ikpe na Naịjirịa maka mpụ maọbụ mmerụaka na-eji ute ọrịa aga n'ụlọikpe.

Ihe ha ji eme ihe a edoghi anya maka na ndị mmadụ ajụọla maọbụ ka ha nweta ebere n'aka ndị mmadụ ka ọbụ ka ha gbanarị ikpe.

na ụmụ Naịjiria na-eche ụbọchi ikpe ọbụla ịhụ nke onye ga-eji bịa nke ya.

Ndị ji akwa bịa n'ụlọikpe:

1. Dino Melaye

Nke dị ụmụ Naịjirịa ọhụụ n'obi ugbua bụ onye na-anọchite anya ndị Kogi west na sineti bụ sinetọ Dino Melaye bụ onye e bu n'ụgbọala e ji ebu ozu na ndị ọịa gaa Kogi steeti ebe ndị uweojii chọọ ikpọga ya ụlọikpe.

Melaye ji akwa ọrịa gaa ụlọikpe ụbọchị Wenezde ebe ọ gara ịnata mgbapụta.

Image copyright Sumner_sambo
Nkenke aha onyonyo Dino si n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ gaa n'ụlọikpe

2. Olisa Metuh

Metuh bụbụ onyeisi ngalaba mgbasaozi nke otu pati PDP jiri akwa ọrịa gaa ụlọikpe n'aAbuja n'ọnwa Feburuwarị afọ a bụ 2018.

A na-ekpe Metuh maka mpụ na mmerụaka ego ruru nde naịra 400.

Ụbọchị o kwesiri igosi onwe ya n'ụlọikpe, e ji ụgbọala e ji ebu ndị ọrịa bute ya n'ụlọikpe ebe ọ nọ n'akwa ọrịa.

E buru ya na akwa ọrịa ya bubata nime ụlọikpe ebe ọ nọ ka onye na-adịghị ndụ.

Tayor wepụtara foto Metuh oge ebu ya banye n'ụlọikpe nime akwa ọrịa.

Ndị ọzọ dara ọrịa oge e bidoro ikpe ha

1. Diezani Allison-Maduekwe

Nwaanyị bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka mmanụ agbidi, e boro ya ebobo mpụ na mmerụaka.

O jighi akwa gaa ụlọikpe mana ozigbo ikpe ya bidoro, akụkọ akụkọ pụtara na ọ na-arịa kansa.

Teliat Kunle dere n'akara twitter ya n'eziokwu mpụ bụ ọrịa.

2. Femi Fani-Kayode

A na-ekpebu Kayode onye bụbụ mịnịsịta na-ahụ maka njem ụgbọelu ikpe gbasara mpụ na ohi ego ruru ijeri dọla anọ n'ụma.

Oge a na-eme ikpe Kayode, ọ gwara ndị ụlọikpe na ya nwere ọrịa mkpụrụ obi.

Image copyright Femi Fani-Kayode/ Facebook

3. Nenadi Usman

Nwaanyị a bụbu mịnịsịta okwu ego dị n'aka.

E boro ya ebubo mpụ, aghụghọ na ohi na mkpamkpa ya na Kayode na Danjuma Muhammed.

Oge e bidoro ikpe ya, ọ gwara ndị ụlọikpe ka ha nye ya ohere ịga ụlọọgwụ na mba ofesi maka na ya nwere kansa.

Ndị ụlọikpe nyere ya ohere ahụ ka ọ gaa mba Amerịka maka ọụ̀wụgwọ ya n'afọ 2017.

Akụkọ ga-amasị gị: