Codeine: NAFDAC awakpoola ụlọọrụ anọ ma kpachie ọtụtụ ọgwụ

Ndị ụlọọrụ NAFDAC Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oge niile ka NAFDAC na-awakpo ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nri na ọgwụ na Naịjirịa nke akpọrọ NAFDAC n'aha ịchafụ wakporo ụlọọrụ anọ na-emepụta ọgwụ na Lagos, Ilorin na Kano.

Mwakpo a, na-eso nchọpụta BBC mere nke gosiri etu ndị mmadụ si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine.

NAFDAC kwuru na mwakpo a ha mere, gosiri na ụlọọrụ ndị a ka na-emepụta ọgwụ ụkwara nwere codeine karịrị ọnụọgụgụ iwu ala nyere ha ohere imepụta.

Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC bụ Mojisola Adeyeye, gwara ndị ntaakụkọ na ugbua, ha na-enyocha ọrụaka ndị ụlọọrụ anọ ahụ BBC gosiri n'ihe nkiri ha.

N'ọnụ okwu ya: "anyị akpachiela ọtụtụ ọgwụ nwere codeine n'ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ n'Ilorin.

Ụlọọrụ Bioraj Pharmaceuticals kwuru na ha akwụsịla ọnye ọrụ ha bụ Junaid Hassan ọrụ n'ike, Emzor kwukwara na ha achụọla onye ọrụ ha bụ Chukwunonye Madubuike n'ọrụ.

Ha abụọ pụtara n'ihe onyonyo BBC dika ndị na-eji azụ aka na-ere ọgwụ codeine.

Mana ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na gọọmenti kwesịrị ịta ndị ụlọọrụ a ahụhụ karịa nyocha a na-enyocha ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara