Nwaanyị ebepụla ihe di ya ji bụrụ nwoke na Legọs

Nma Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke a bụghị nke mbu a na-enwe ogbugbu site n'esemokwu di n'etiti di na nwunye.

Ndị mmadụ bị na ''Diamond estate'' dị na Sangotedo, Ajah hụjuru anya ka otu onye ọkaiwu nwaanyị akpọrọ Udeme Odibi were mma sụgbuo di ya bụ Otike Odibi.

Akụkọ kwukwara na o bepuru ihe di ya jiri buru nwoke ma were mma sụọ onwe ya.

Udeme onye gbara afọ iri anọ na asaa kwuburu na ọ ga-egbu di ya ụbọchị na-esote ụnyaahụ ka ha sechara okwu.

Di ya gwara ndị agabata obi na ndị be ya maka iyi egwu nwunye ya kwuru n'ọnụ n'ekwenti tupu ọ laba ụra.

Mana Udeme mezuru iyi egwu ya site n'ịsụgbu di ya, wepụta eriri afọ ya.

Onye na-ekwuchitere ndị uweoji ọnụ na Legọs bụ Chike Oti kwetere na nke a mere eme ma kwuo na di na nwunye a ebiela afọ atọ jupụtara n'ọgụ na mgba.

O kwuru na ha amụtaghị nwa mana di nwaanyị a mụtara nwa nwaanyị n'alụm di na nwunye ọ nọ bu na ya.

Oti kwuru na tupu ndị uweoji awụchie n'ebe ihe a mere , Udeme onye nke chọrọ i were ndụ ya ka o gbuchara di ya nwetere enyemaka n'aka ndị agabata obi kpọgara ya ụlọọgwu.

Onye nkwuchite ọnụ ndị uweoji a kwuru na onyeisi ndị uweoji kachasị na Legọs bụ Edgal Imohimi ezigala ndị uweoji na-ahụ maka mpụ imeụlọ na nyocha ahụ ka ha ga nyocha ihe mberede a mere nu.

O kwuru na Imohimi nyere ndụmọdụ ka di na nwunye na-eme udo ezinụlọ n'ụzọ na agaghị ewebata ihe ike.

Akụkọ ndị ga-amasị gị :

Isiokwu Ndị Emetụtara