Akụkọ kachasị n'abalịa: Buharị na Trump akpaghị maka Biafra
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Ebe foto si, Getty Images
Otu dị iche iche na-akwado nwere onwe Biafra sịrị ndị ọchịchị Naịjirịa ha ejizila nwere onwe Biafra eti epele
Otu na akwado nwere onwe Biafra akọwala ọgbakọ onyeisiala Buhari na nke Donald Trump mba Amerika nwere dịka ọgbakọ na-adịghị asọ.
Otu a kwuru ihe a n'Enugu mgbe ha kwara arịrị na onweghị Biafra ha kpara n'ọgbakọ ahụ agbanyeghị ka esi egbụ ọtụtụ n'ime ha na Naịjirịa.
Ndị NAFDAC na nyocha ndị ọrụ na-arụpụta Codeine
Ebe foto si, Getty Images
NAFDAC sị na ha na-ebebi ngwaahịa ọjọọ ha jidere
Ndị ọrụ na ahụ maka ọgwụ na nri bụ NAFDAC ekwuola na ha amalitela itinye anya nchọpụta na ụlọọrụ anọ ndị ahụ akpọrọ aha ha na ihe onyonyo ndị BBC gosiri.
Ihe onyonyo ahụ chọpụtara na ụlọọrụ anọ ndị ahụ dị na Legos, Ilorin nakwa Kano steeti ebe NAFDAC wakporo ụlọọrụ ndị a ma chọpụta na ha emerụọla ala.
Ntuliaka ga na-aga n'ihu na UK ugbua.
Ebe foto si, Getty Images
Ebe ụfọdị na UK iwu chọrọ ka ndị mmadụ gosi akwụkwọ njirimara tupu ha eme ntuliaka
N'ofesi, ka ọdị ụgbụa, atụm votu na aga n'ihu maka nhọpụta ndị isi okpuru ọchịchị dị iche iche na UK.
Ihe dịka oche puku anọ (4000) ka a ga-ahọpụta ndị ga-anọ na ha na ntụliaka a.
N'egwuregwu
Arsenal na Atletico Madrid ga akụkọrịta mpi n'abalịa
Ebe foto si, Arsenal/twitter
Mgbe ikpeazu ndị otu abuo a sọrọ mpi na 26 April 2018 ha gbara onwe ha 1-1
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo taa
Joe Igbokwe sị na ndị Igbo amaghị ndọrọndọrọ ọchịchị.
Asambodo gị o na-enye gị nri ?