Akụkọ kachasị na mgbede a: Mee 30 bụ ụbọchị ncheta Biafra

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Ipob kpọrọ okụ ka a nọrọ n'ụlọ na Mee 30

Nkọwa foto,

30 Mee bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Biafra

Ebe Zionists Movement na-akpọ oru na Igbo ka ha lọta n'uju maka ncheta Biafra, Ipob akpọkuola Igbo ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee maka ncheta ndị egburu egbu n'agha Biafra.

Onye mgbasaozi ndị Ipob bụ Emma Powerful, bụ onye kpọkuru ndị ọbụla nwere mkpagbu na Naịjirịa ka ha soro na ya bụ ntukwu n'ụlọ nke iwe.

Ndị uweoji emeela ngagharị iwe n'Abuja taa.

Nkọwa foto,

Ndị uweojii anaghị agba akabe abụbụ ọrụ a

Iwe ha bụ na ha aghọtaghị ebe isiakwa dị a dị gbasara ụgwọ ọnwa ha dịka otu onye n'ime ha na-achọghị ka a kpọọ aha ya siri kwuo.

Ebugala Dino Melaye ụlọọgwu n'Abuja

Nkọwa foto,

Ndị uweojii kwuru na ndị interpol bụ ndị na-enyocha Dino

Ozị rutere BBC ntị ugbua na-ekwu na a hapụla Dino Melaye n'akaebe maka ịga ụlọọgwụ.

Justice Ajanah Nasir bụ onye ọkaikpe ukwu, nyere ikike ka e buru Melaye gaa ụlọọgwụ Abuja maka ịzọ ndụ ya.

N'egwuruegwu,

Nkọwa foto,

Manchester United na Brighton

Ndị Manchester United na Brighton ga-akwakọrịta mpi n'elekere asatọ nke abalị a.

Nkeji nke abalị a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịko taa niile

Ihe onyonyo taa

Aha onyonyo,

Ihe onyonyo ndị NURTW wakporo ndị ọrụ n'Agege

Akụkọ ndị ga-amasị gị