'Aka m adịghị na ọgbaaghara dara na Rivers' - Amaechi

Rotimi Amaechi Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015

Minista na-ahụ maka ibugharị mmadụ site otu ebe ruo ebe ọzọ n'ime Naịjirịa bụ Rotimi Amaechi ekwuola na ọbụghị maka ya ka ọgbaaghara dara na Rivers steeti ugbua.

Otu ndọrọndọrọ APC ga-eme ọgbakọ ha taa mana ọtụtụ mmadụ na-eme nghagharị iwe batara n'ụlọ ọrụ APC ụnyahụ n'iwe, ha kwuru na obi adịghị ha mma gbasara ọtụtụ ihe na-eme na APC.

Ha kwukwara na ndị na-akwado Amaechi n'ime APC na-achọ ị kwusị ndị na-akwado omeiwu Magnus Abe ị bata n'ọgbakọ a.

Ha na-ebo kwa Amaechi na ndị na-akwado ya ji azụ aka na-ere akwụkwọ eji edenye aha maka ọgbakọ a.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo APC bụ otu ndọrọndọrọ na-achị Naịjirịa ugbua

Mana Amaechi kwuru na onweghị onye obụla na-ere akwụkwọ a. N'ime ọnụ ya: "biko gaa ụlọakụ jee zụọ akwụkwọ nbinye aka gị, sọọsọ ebe ahụ ka ha na-ere akwụkwọ a".

Ka ọ dịgodị, gọvanọ Rivers Steeti bụ Nyesom Wike ka na-achị ọchị na ihe a na-eme na APC gosiri na otu ndọrọndọrọ ọchịchị a nwere nnukwu nsogbu gbasara nkewa dị n'etiti ha.

N'otu akụkọ a, mana n'aka nke ọzọ, onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari nọ na Daura, onye enyemaka ya puruiche n'ọrụ gbasara mgbasaozi bụ Garba Shehu kwuru na o ga-esi Daura gaa Rivers maka ọgbakọ APC na steeti ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a