Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Benue na-akwado ị kpe gọọmenti na UN

Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a:

Otu dị iche iche n'ime Benue chọrọ ị kpe gọọmentị na UN

Image copyright Getty Images

Otu dị iche iche n'ime Benue steeti ekwuola na ha ga-ekpe gọọmentị Naịjirịa na ngalaba na achịkọta mba uwa akpọrọ United Nations na bekee.

Ha kwuru na ha na-ekpe gọọmentị makana ha sara anya na-ele ka ndị ọchị ehi jiri egbe na-egbu ọtụtụ mmadụ na Benue steeti

Ọkụ erefuola ego ruru nde naira 506 n'Anambra

Image copyright Getty Images

Onye isi ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ n'Anambra steeti bụ Martin Agbili ekwuola na akụ ruru nde naira narị ise na isi bụ ihe lefuru n'ime ọtụtụ ọkụ gbara na steeti ahụ n'etiti ọnwa December afọ 2017 na Epureel 2018.

O kwuru nke a n'ụbọchị ncheta ndị ụlọọrụ mmenyụ ọkụ ha mmere na Awka.

Mana o kwukwara na makana ọtụtụ mmadụ na-akpọ ha oge niile ọkụ na-agba, ụlọọrụ ha zọpụtara akụ ruru ijeri naira iri na otu na abụọ.

Ugwu na-agbọpụta aja ọkụ emebiela ọtụtụ ụlọ na Hawaii

Image copyright Getty Images

Gọọmentị ala ahụ agwala onye ọbụla bi na mpaghara ebe ihe a mere ka ha gbaa ọsọ ndụ kpam kpam.

Ha kwuru na maka ikuku sulphur dioxide kari akari na mbara ikuku, agaghị enwe ike ị zọpụta onye ọbụla ka nọ n'ebe ahụ.

Brighton na Holve Albion na-achị ọchị

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu

Otu Brighton na Holve albion emeriela Manchester United n'asọmpị iko Premier League otu akpụ asataghị ihe.

Mmeri Brighton n'asọmpị a mere ke a pụọ n'ime otu ato nọ n'ikpeazu.

Manchester United ka nọ na akara abụọ n'asọmpị iko Premier League.

Gee akụkọ anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile