Adeboye: Naijiria ga-ekewa ma ogbugbu mmadụ ga n'ihu'

Pastọ Enoch Adeboye Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Adeboye: Onye otu kraisti ọbụla e gburu bụ nwa m nwoke maọbụ nwam nwaanyị

Onyeisi Redeemed Christian Church of Christ bụ Pastọ Enoch Adeboye ekwuola na Naijiria ga-ekewa ma ọ bụrụ na gọọmentị ala Naijiria emeghị ihe maka oke ọgbụgbụ mmadụ na-eme n'akụkụ dị icheiche n'ala anyị ugbua.

Adeboye onye kwuru nke a n'ọgbakọ Mụọ Nsọ nke ọnwa Mee nke ndị ụka ya mere na ngwụcha izu, kwuru na ikekwa, ´ọ bụrụ na ọgbụgbụ akwụsịghị, agaghị e nwe ntuliaka na 2019".

Ọ dọrọ gọọmentị Naijiria aka na ntị ka ọ mee ngwangwa kwụsị ọgbụgbụ mmadụ maka ọkpụkperechi nke na-eme n'akụkụ dị icheiche.

Dịka o siri kwuo, emeghị otu a, Naijiria ga-agbasa.

Adeboye tụrụ arịrị maka ogbugbu ndị ọchịehi gburu ụkọchụkwụ Katolik abụọ na ndị ụka ruru iri na asaa na Benue na nsonso, sị na dịka ndị otu Kraisti na Naijiria na-akpọ ya 'nna' na onye otu kraistị ọbụla e gburu bụ 'nwa' nwoke maọbụ nwaanyị.

Akụkọ ga-amasị gị