Arsene Wenger efeela aka ikpeazụ dịka onye nchịkọta Arsenal taa

Arsene Wenger Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Arsene Wenger chịkọtara Arsenal afọ iri abụọ na abụọ

Arsene Wenger nwetara ekele pụrụiche ka ndị Arsenal na ndị nkwado ha sịrị ya 'daalụ maka ọlụ ọma' ọ lụụrụ ha n'ime afọ 22 ọ chịkọtara ha.

Ka ha na ndị otu Burnley zukọchara n'asọmpi Premier League, ha kelere Wenger maka na ọ bụ egwuregwu ikpeazụ nke Arsenal ga-agba na be ha bụ Emirates n'afọ a tupu ọ pụọ.

Wenger dị afọ iri isii na asatọ (68) nabatara ekele ha ma kwuo na obi dị ya ụtọ na ha hapụrụ ya ka ọ chịkọta ha afọ ole ahụ.

O kwuru "Daalụ nụ maka ikwe ka mụ na unu nọrọ ruo ugbu a, mana nke kachasị nke, a dị m ka unu - a na m akwado Arsenal."

"A ga m na-akwado Arsenal ruo echi. Ọ bụ ihe jikọtara anyị n'ime mkpụrụndụ nke ahụ anyị, ebumnobi nakwa nchegbu ndị ahụ."

Ọ gara n'ihu kwuo "Ọ ga-amasị m ikele onye ọbụla nọ n'otu a na-eso eme ka otu a bụrụ ọpụrụiche."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Arsenal kwadoro ọfụma ịsị Arsene Wenger 'ka emesịa'

"Ndị otu egwuregwu na-agba ugbua nwere ahụmara pụrụiche, ma n'ọgbọ egwuregwu ma n'ezi. Kwado ha n'afọ na-abịa maka na ọ kwesịirị ha."

"Owu unu ga-ama m. Daalụ nụ maka isonye n'ihe dị ezigbo mkpa na ndụ m. Ọ bụ olileanya m na m ga-ahụ unu mgbe na-adịghị anya."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Arsene Wenger ekwubeghị ma ọ na-ala ezumiike nka ka ọ ga-achịkọta otu ọzọ

Ndị Arsenal nyere Wenger iko ha nwetara n'afọ 2003/2004 oge ha gbachara otu afọ bọọlụ a na-emerighị ha, ka ọ bụrụ ihe ọ ga-eji na-echeta oge ọ chịkọtara ha.

Tupu ọ pụọ n'ọgbọ egwuregwu, otu nwatakịrị nna ya ku n'olu ya weliri akwụkwọ iji rịọ Wenger akwa eriri olu ya (tie), nke mere ka Wenger yipu ya ma nyekwa nwata ahụ.

Ndị ọzọ na-ahapụ Arsenal

Ọ bụghị naanị Wenger na-apụ n'Arsenal n'afọ a.

  • Per Mertesacker bụ onye ndu otu egwuregwuArsenal (captain) ga-akwụsị ịgba bọọlụ ma bido ịrụ ọrụ n'ụlọakwụkwọ ha.
  • Alex Scott na-agbara ụmụnwaanyị Arsenal na ndị ụmụnwaanyị England bọọlụ na-ala ezumiike nka.
  • Vic Akers bụ onye bidoro otu ụmụnwaanyị na-agbara ndị Arsenal bọọlụ na-alakwa ezumiike nka ma afọ a gwụ.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị na-akwado Arsenal kelere Arsene Wenger maka afọ iri abụọ na abụọ ọ chịkọtara ha

Arsenal nọ n'ọkwa isii na tebulu premier league nke afọ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a