Achọtara ozu mmadụ 45 n'obodo Gwaska na Kaduna

Egbe onye uweojii naịjirịa ji Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndi mere ihe ahụ gbagburu ụmụaka na ndị okorobia na-agbalị iche obodo ahụ nche

Ọ bụ iru uju na anyammiri na-ewu n'obodo Gwaska ebe ndị omekome bu egbe wakporo obodo ahụ dị na Kaduna steeti.

Ndị ka dị ndụ ebe ahụ sị na ndị bu egbe si na mpaghara Zamfara mapụta, gbaa obodo gburugburu wee malite ịgba egbe.

Ka-akụkọ a na-apụta, achọtala ozu ruru 45 ebe a na-atụ egwu na ozu ndị ọzọ ka nwereike ịdị n'ọhịa.

Agbakwara ụfọdụ ụlọ obibi ọkụ ebe ndị hụrụ ihe mere na-akọwa na ọ bụ ụmụaka na ndị nche bụ ndị mgbọ kachara metụta.

N'akwụkwọ ọgbakọ ndị nche na Birnin-Gwari dere, ha dụrụ ndị obodo ahụ ndụmọdụ ka ha saa anya mmiri maka akwamozu ndị nwụrụ anwụ na-abia n'ọdịnihu.

Cheta na nke a ga-eme ya ugboro abụọ a ga-awakpo obodo Birnin Gwari n'ime ụbọchị ole na ole.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a