Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Cardiff city abaala Premier Lig

Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Egburu ọchụ na Birnin Gwari ọzọ.

Ndị agha Naịjiria ebe ha nọ n'ọzụzụ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Ndị agha Naịjiria nyere ndị nche obodo aka ịchọta ozu ndị mmadụ

Ndị nche obodo na ndịagha Naịjirịa ebupula ozu ruru iri anọ na ise n'obodo Gwaska ebe ndị omekome wakporo Birnin-Gwari ọzọ.

Agbakwara ụfọdụ ụlọ obibi ọkụ ma na-atụ egwu na a ga-achọta ozu ndị ọzọ n'ọhịa.

Ebe ọzọ na Naịjirịa.

Ihe iru uju emetụtala ndị uweojii ka mmadụ ise ndị uweojii nọ n'ọzụzụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ.

Mmadụ ise a nwụrụ ka ụgbọala ha ji eme njem nwuuru ọkụ n'okporoụzọ Kano-Zaria ka ha nọ na-alaghachi ebe obibi ha.

Akụkọ kwuru na ha chọrọ ịlaru ụlọ maka ọbere ezumike ha nwetara n'ụlọakwụkwọ tupu ihe mberede a emee.

Na Mba ofesi,

Ebe foto si, OZAN KOSE

Nkọwa foto,

Ide yiri nke a burukwara ụgbọala n'afọ 2017

Ide mmiri sitere n'oke mmiriozuzo emerụọla mmadụ isii ahụ na mba Turkey.

Ide a burukwara ụfọdụ ụgbọala ma mebie ọdọ ahịa dị icheiche n'isi obodo Turkey bụ Ankara.

Enweghị onye nwụrụ n'ime ide a.

N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Otu Cardiff city na-eme emume mbugo ha na Premier Lig

Ka a na-ahazi ọkwa Premier League maka imechi asọmpị ahụ, ka a na-ahụkwa ndị mmeri na ndị emeriri.

Cardiff City esonyela na ndị a ga-ebuba n'ọkwa Premier League ugbua, ebe otu bọọlụ Birmingham meriri Fulham

Gee nkeji anyị na mgbede a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla