Legos: Ụmụnwaanyị dị ime 2131 na-arịa HIV

Pregnant HIV patient Image copyright AFP

Opekata mpe ihe ruru ụmụmnwaanyi dị ime karịrị puku abụọ na-arịa ọrịa HI nke a kpọrọ HIV na bekee.

Kọmishọna ahụike na Legos steeti bụ Dkta Jide Idris kwupụtara nke a na nsonso na mkparịtaụka ya na ndị ọrụ ntaakụkọ na nsonso a.

Idris kwuru na n'ime ụmụnwaanyi dị ime dị 38,791 e nyochara n'afọ 2017 maka ọrịa ahụ, 2,131 nwere yabụ ọrịa.

"Opekata mpe, ụmụnwaanyị dị 38,791 dị ime matara ọnọdụ ha , ebe e tintyere ihe dịka 2,131 ndị a chọpụtara nwere orinchekwaahụ na atụmatụ igbochi nne inye nwa ọrịa orinchekwaahụ."

O kwuru na emere nyocha ahụ site na ego enyemaka si n'aka otu na-agba mbọ maka ibelata mgbasa ọrịa mminwụ (AIDS) bụ Global Fund.

Idris kwuru na nkwado ahụ nke ha jiri mee ntule atụmatụ ahụ bido n'ọnwa Janụwarị rue Disemba, afọ 2017 na Global Fund wetara USD9,623,390.08 maka iji zụọ ọgwụ na ihe nnyemaka maka ndị na arịa ọrịa orinchekwaahụ, ime nchọpụta n'ọkpụrụ ọchịchị atọ dị na steeti ahụ , ebe Legos steeti wetara otụ n'ụzọ iri ego ahụ.

Ọ gara n'ihu kọwa na ka ha mepụtachara atụmatụ ahụ, mmadụ dị 26,768 persons (+15yrs ruola afọ iri na ise ha narala ndụmọdụ nakwa nyocha ma ha e nwere ọrịa orinchekwa ahụ, ebe e tinyerela 10,623 n'atụmatụ ịnara ọgwụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a