Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo

Mba niile nakwa agbụrụ niile nwere ihe ha na-asọ nke ha na-ewe na ime ya ga-ebutere ha ọdachi.

Ime ụfọdụ ihe ndị ahụ mgbe gboo nwere ike ibute nsọ ala na ịsacha maọbụ Ịkwụ ala nke bekee kpọrọ 'cleansing'.

Ụfọdụ n'ime 'nsọ' ndị a bụ ihe ndị a mụrụ n'ọgbara ọhụrụ nwere ike ịhụta dịka ihe na-atọ ọchị, maka etu o si dịka ihe na-araghị ahụ.

Lee ihe isii (6) ndị Igbo na-ewe ka nkwenkwe ụgha nke bekee kpọrọ 'superstitious belief'.

1) Ịṅefe nwaanyị dị ime ụkwụ: Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ka mmadụ tiri mkpụ "ngwa gafegharịa ụkwụ ya ọsịsọ". Nke a na-abịa ma ị gafee ụkwụ mmadụ ọkachasị nwaanyị dị ime.

Ha na-ekwu na Ị ṅefee ụkwụ nwaanyị dị ime, na ị ga-aghọgburu ya nwa nọ ya n'afọ (ya bụ na nwa ya ga-eyi gị kama iyi nne na nna ya) maọbụ ọ ga-amụta akpụda.

Image copyright Getty Images

2) Aka ịkọ ụkọ: Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ọbaaka na-akọ gị ụkọ na ọ pụtara na ezigbote ego ga-abanye aka n'oge na-adịghị anya.

3) Iji aka ekpe: Ụfọdụ na-ekwu na iji aka ekpe enye mmadụ ihe adịghị mma. Ha sị na ọ bụ mkparị nye onye ị na-enye ihe ọkachasị ọ bụrụ onye tọrọ gị.

4) Igbu mkpọrọhịhị: Ndị Igbo kwenyere na onye na-egbu mkpọrọhịhị n'abalị na-akpọpụta agwọ nke nwere ike ịbata n'ụlọ. Ha na-ekwukwa na mkpọrọhịhị na-ebutekwa mmụọ na-aga n'abalị.

5) Azala ụlọ n'abalị: Oge mmadụ na-eto, ọtụtụ ndị kwenyere na ịza ụlọ n'abalị na-akpọlite ndị mmụọ. Ha kwenyekwara na ịza ụlọ n'abalị bụ izafu akụnaụba dị n'ezinaụlọ ahụ.

N'otu aka ahụ, ụfọdụ ndị Igbo anaghị ekwe ka ọnụ azịza metụ ha n'ụkwụ. A na-ekwu na ọnụ azịza metụ gị n'ụkwụ na ọ ga-ewepụ ihe ị ji bụrụ nwoke.

Image copyright Getty Images

6) Ịza oku: Ndị Igbo na-ekwu na ị nụ aha gị ma ị hụghị onye kpọrọ gị oku, na gị azakwala.

Ha kwenyere na ịza oku a nwere ike ibute ọnwụ maka na 'ọ bụ chi gị na-akpọ gị'.

7) Ịgba aka ahịa: Ụfọdụ ndị kwenyere na ọ bụrụ na ị kwụọ ụgwọ ma ị gote ihe n'aka ha, na ị bupula njọ ahịa gaara ajọ ha ụbọchị ahụ. Ha kwenyere na ị ga-ebutere ha akanchawa.

Image copyright Getty Images

8) Ịghọ njọ maọbụ ịdọ ashị: Ụfọdụ kwenyere na ọ bụrụ na otito too gị n'anya, na ọ pụtara na ị naghị enye mmadụ ihe.

9) Ịma uzere: Ụfọdụ ndị na-ekwu na ị maa uzere na ọ pụtara na mmadụ na-akpọ aha gị n'otu ebe.

10) Iji enyo aga ahịa: Ụfọdụ ndị na-ekwu na ị were enyo gaa ahịa, tinye ya n'etiti ụkwụ gị, na ị ga-ahụ ndị mmụọ nakwa ndị ụkwụ ha na-anaghị emetụ ala.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ị chọrọ ịhụ mmụọ?

Ị ma ndị ọzọ?

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a