Ndị uweojii: Ọkaiwu gburu di ya chere ya eche

Ikpe nkwụmọọtọ Image copyright Uche Akolisa

Kọmịshọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi gwara ndị ntaakụkọ na onye ọkaiwu aha ya bụ Udeme Odibi nke ji mma sụgbuo di ya chere ya eche tupu o me ya.

Oriakụ Odibi, onye dị afọ 37, ekwetela na o mere ya bụ ihe.

Odibi ji mma bepụ ihe di ya ji bụrụ nwoke, nye ya n'aka ma sukwa onwe ya mma n'ụbọchị Tọzde gara aga.

Dịka Imohimi siri kọwa, nwaanyị ahụ nke ya na dị ya lụọla dị na nwunye afọ atọ gara aga na amụtaghị nwa, zụrụ mma ọhụụ o jiri gbuo di ya dị afọ 50.

O kwukwara na Otibi chịkọta asambodo ya, ma kwadokwa onwe ya maka iji ụgbọelu ifepụ ga mba Briten n'ụbọchị Tọzde.

O kwuru na nwaanyị ahụ kpọrọ agbataobi ha, nwanne di ya nwaanyị nakwa nne di ya gwa ha na di ya kwuru na ọ ga-egbu ya.

Imohimi sị, " A ka na-eme nchọpụta ihe mere nwoke ahụ n'ụlọọgwụ Lagos State University Teacching Hospital, Ikeja, ebe nchikọta nyocha ihe mere nke anyị ga-ekwupụta gwa ọhanaeze ka na-aga n'ihu."

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a