Ichi e gburu mgbe gboo

Igbuichi
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ nwụrụ maka ịgbuichi a

Ọ ga-atụ gị n'anya, mana foto a na-egọsị ụdịrị ichi ndi mmadụ na-egbu n'ala Igbo mgbe gboo.

Ịgbuichi dị ụzọ abụọ ama ama. Otu bụ ụdịrị ndị Nri na echi, nke ọzọ bu nke ndị Agbaja. Ichi Nrị na-ewu bu na gbụrụgbụrụ Ọka bu obodo di na Anambra steeti ugbua, nke Agbaja si na gbụrụgbụrụ Ọgwụ nke dịzị na Enugwu steetị.

N'ime akwụkwọ akpọrọ Journal of International African Institute na Bekee, ha kọwara na ndị Igbo anaghị egbu ichi maka ị gosi ebe onye gburu ya sịrị bia.

Ọ bụ maka igosi ogo, ọkwa maọbụ ugwu, na ị gosi na onye ahụ abaala otu ndị ọzọ.

Ha na-akpọ ndị gburu ichi ndịnze maọbụ ndịichie.

Nkenke aha onyonyo Naanị ndị dị ike ga-egbụ ichi

Dịka omenaala siri kwu, ọ bụ sọọsọ ndị gburu ichi ga-emeri ọnwụ.

N'oge ahụ, ha nwere nkwenye na ndị gburu ịchị ga-ebi ebeebe n'ala ndị mmụọ.

Ndị gburu ichi anaghị arụ ọrụ dịka ndị ọzọ, ha anagị ebu ihe ọbụla n'elu isi ha. Ọ bụ arụ ị chọ ha okwu obụla maọbụ kpaso ha iwe.

Igbuichi dị icheiche n'ala Igbo

Ọ dị ezigbo mkpa ka ọnwa na anyanwụ dị n'ichi ọbụla ha ga-echị.

Ọnwa na-ebụrụzọ, anyanwụ na-esote ya, nke atọ ga-abụ ichi ahụ.

Ogbanje

Nkenke aha onyonyo Otụtụ ndị igbo nwere nkwenye na Ogbanji ka dị ire

Igbuichi ọzọ ha na-egbu bụ maka ụmụaka ha chere na ha bụ ogbanje.

Dịka omenaala siri kwu, ha na-egbu ha ichi a ka mmụọ ogbanje naghị mata ha ma ọ bịa ọzọ.

Ọzọ bụ igbu ichi maka ntị fụrụafụ.

Ndị Igbo nwere nkwenye na igbuichi a ga-eme ka ntị ọbụla fụrụafụ gba mmee nakwa da ba n'ime.

Etu e siri egbuichi

Ọ bụ n'isi ụtụtụ ka onye chọrọ ị gbu ichi ga-ebilite, pụọ n'iro, dina n'ala cheli ihu ya elu.

Ha ga-eji mma toro ogologo dị nkọ gbuo ichi a.

Ọ bụ arụ ka onye ahụ bee akwa, maọbụ tie mkpu mgbe a na-egbu ya ichi a.

Onweghị ihe ọbụla ha ga-enye ya maka ị nye aka ịdị ụfụ maọbụ ị kwụsị ọbara ga-agba n'oge igbu iche a.

Nkenke aha onyonyo Igbuichi a bụ maka ị chọ mma

Onweele ndị nwụrụ mgbe a na-egbu ha ichi, otụtụ ndị ọzọ kpuru isii maka ihe a.

Ọ bụrụ na onye ha na-egbu ichi bee akwa, e nwere ike ị napụ ya akụnaụba ya.

Ebe anaghị egbuichi n'ahụ mmadụ

Anaghị egbu ichi na obi, uvu maọbụ n'ụkwụ, ọ bụ sọọsọ n'ihu na afọ ka ha na-egbu ichi.

Nkenke aha onyonyo Igbuichi bụ ihe ogo

Ihe kwụsịrị igbuichi

Ugbua, onweghị onye ị ga-ahụ gburu udịrị ichi a na egbu mgbe gboo.

Onya ọkammụta aha bụ Chigozie Nnabuihe kwuru na ndị niile gburu ichi a anwuchaala.

O kwukwara na ọbịbịa ụka otu Kraịst mere ka ọtụtụ mmadụ kwụsị igbuichi.

N'ime akwụkwọ Journal of International African Institute, otu nwoke a jụrụ ajụjụ kwuru na ụmunwoke ugbua anaghị enwe ike idi ụfụ ga-apụta na igbu ichi a.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a