Gọọmentị chọrọ itinyekwu n'afọ e ji agụ mahadum

Prof Anthony Anwukah Image copyright Federal Ministry of Education website
Nkenke aha onyonyo Anwukah: Ndị mahadum Naijiria na-azụpụta anaghị egbo mkpa ndị ọrụ a chọrọ maka ụlọọrụ mmepụta ngwa ahịa

N'ihi na ọtụtụ ndị gụrụ mahadum ezughị oke na mmụta maka ịrụ ọrụ n'ụlọọrụ, gọọmenti etiti na atụghari uche itinyekwu otu afọ na afọ ole ụmụakwụkwọ mahadum na anọ n'ụlọ akwụkwọ.

Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Anthony Anwukah kwụpụtara nke a n'Abuja n'ọgbakọ ndị isi ọchịchị mahadụm gọọmenti etiti na Naijiria.

Anwukah kwuru na mahadum dị na Nigeria akpụọla afọ n'ala na ịzụpụta ndị ga-enyere Naijiria aka ịbụ mba bụ ọkaibe na imepụta ihe.

N'okwu ya; "Ndị na-agụ maka iwu na-aga ụlọkwụkwọ iwu otu afọ, tupu ha agawa maka ife ala nna anyị, ndị gụrụ maka ahụike na aga ọzụzụ otu afọ, ya mere ọ ga-adị mkpa ka ndị ọzọ na agụ ihe ndị ọzọ mee ka ndị a."

O kwuru na ọ ga-adị mma ka ha na-aga ụlọakwụkwọ Lagos Business school maka ọzụzụ pụrụiche.

Anwukah onye tụrụ arịrị na ndị mahadum Naijiria na-azụpụta anaghị egbo mkpa ndị ọrụ chọrọ maka mmepụta ngwahịa ma ja ha ike ka ha nye aka kwalite agụmakwụkwọ na-ada ada na najiria.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara