Uru ise dị na mgbanwe ego Nigeria na China mere

Naira-Yuan Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Naijiria na China nwere nkwekọrịta mgbanwe ego ọnụahịa ya pụtara ijeri naira 844 nke pụtara ijeri Yuan 15

Ndị ọkacharamara na-akọwa mkpa ọ dị ka Naijiria ike nkwụcha n'atụmatụ mgbanwe ego anyị na China mere na nsonso ìji nweta uru dị ya, ma gbalahụ ọghọm.

Naijiria na China nwere nkwekọrịta mgbanwe ego ọnụahịa ya pụtara ijeri naira 844 pụtara ijeri Yuan 15 maọbụ $2.36.

Uche Uwalaeke bụ ọkammụta n'ihe gbasara ego na Nassarawa State University na Ken Ụkaọha bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ahịa na Naijiria kwenyere na nkwekọrịta a Naijiria na China mere ga akwalite akụnaụba ala anyị.

Mana ha dọrọ gọọmenti aka na ntị ka ha gbaa mbọ hụ na Chịna bịara rụọ ụlọọrụ mmepụta ngwahịa ha na Naijiria iji nye ohere ka ndị ala anyị mụta nka imepụta ihe ndị a n'onwe ha.

Lee ole na ole na uru na ọghọm dị ya:

URU DỊ NA YA

1. Ọ ga-enyere azụmahịa aka

Ha kwuru na ọ ga-enyere ndị na-atụbata ihe aka inweta mgbanwe ego iji zụta ahịa na China na-enweghị mkpa ị ga nwe ego na dọla nke na-arịa ahụ ugbua.

Uwaleke kwuru, "China bụ otu mba kachasị na ndị ha na Naijiria na-azụkọ ahịa. Ọ ga-eme ka azụmahịa gaa ọfụma."

2. Ọ ga-enye aka ka ọnụ ego Naira na ebe dọla dị gbalite

Ndị ọkacharamara na-ekwu na ọ ga-ebelata oke ịchụgharị dọla.

Uwaleke sị "Ọ ga-eme ka foreiegbn exchange gbalite, ka ọnụego mgbanwe ego(exchange rate) gbalite".

Uwaleke kwukwara na ọ ga-eme ka naira sikwa ike n'ihi na ndị Naijiria "na-achọ dọla ga-ebelata. Ọke ọnụ ahịa ga-ebelatakwa"

3. Ndị mba iwepeta ego n'ala Naijiria

Ukaọha gara n'ihu kọwa na ọ ga-eme ka ndị ojiegoachụego ndị China bịa na Naijiria tinye ego na akụnaụba ala anyị

4. Naijiria ga-ebitenwu ego n'ọnụ ala na China

Naijiria na ndị ojiegoachụego ga na enweta ohere ibite ego n'ọnụala na China.

5. Naijiria ga-na enweta ego site na ịna ụtụ

Ukaoha kwuru na gọọmentị ga na-enweta ego site na ịna ụtụ na ngwaahịa e si China atụbata

OGHOM DI NA YA

Mana ọ bụrụ na gọọmentị akpachapụghị anya na ịhazị atụmatụ ahụ nke ga-adị afọ atọ, ọghọm nwere ike imebi ihe ga-aba ya.

1. Oke mbubata ngwaahịa China

Uwaleke kwuru ga-eme ka ngwaahịa si China kalia na Naijiria nke nwere ike imemina ụlọọrụ mmepụta ngwaahịa nke ndị Naijiria.

Ọ dụrụ ọdụ ka "Gọọmentị nwere ike tinye ego n'ụtụ a na-ana n'ahịa e si China bubata, iji belata nke a".

N'otu aka ahụ Ụkaọha kwuru na ọ dị mkpa ka Naijiria kwube okwu ihe anyị ga-na-emepụta aga na-ezipụ China ka ọ ghara ị bụ sọsọ ha na-ebujuu ngwahịa ha n'alka anyị.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara