Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: APC Ekiti ahọpụtala ụbọchị mmegharị ntuliaka imeụlọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ebe foto si, @officialAPCng
E tinyela ụbọchị ọhụrụ maka ị me ntuliaka imeụlọ nke APC n'Ekiti steeti nke akagburu akagbu.
Ndị isi pati APC họrọ ụbọchị iri n'otu nke ọnwa Mee (May 11) ka ha mechara nzụkọ gbatagbata maka ọgbaaghara mere na ntụliaka nke ha mere na Satode gaara aga.
Ebola alaghachitela ọzọ
Ebe foto si, AFP
WHO kwupụtara na mmadụ abụọ bu ọrịa ahụ, ebe mmadụ 17 nwụrụla díka a na-eche na ọrịa ahụ bidoro ọzọ na Bikoro dị na mba ahụ.
Ndị uweojii anwụchiela otu abụọ ha kwuru na-azụ ahịa egbe na Benue steeti
Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii bokwara ndị a ruru iri n'otu ebubo na ha na-ebunye ndị ntọ na ndị omekome egbe ha jị arụ ọrụ mwakpo ndị mmadụ.
Ha chọtara mgbọ, egbe dị icheiche na ngwa ọgụ ndị ọzọ ndị a bu agagharị.
Emzor ekwuola nke bụ ezie maka akụkọ NAFDAC ịkpọchị ụlọọrụ ha
...Ebe sinetọ akpọrọ Shehu Sani katọrọ ihe a ndị NAFDAC mere n'elu soshal midia Twitter:
FIFA adaala Russia nha maka egwu ịkpa oke agbụrụ.
Ebe foto si, AFP
FIFA dara mba Russia nha puku pounds iri abụọ na abụọ(22,000GBP) maka egwu ịkpa oke agbụrụ ndị na-akwado ha na-agụ mgbe otu France na Russia gbara bọọlụ n'ọnwa Maachị.
Paul Pogba, Ousmane Dembele and N'Golo Kante ndị ọgba bọọlụ mba France bụ ihe ndị a metụtara.
Ha kwuru na ha a gaghị enye otu ọbụla ohere ịkpa oke agbụrụ n'asọmpị iko mbaụwa n'abịa chaachaa.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Gọvanọ Umahi sị sị kpụta Charles Ogbu, gini ka omere?