Ebola: Ndi na-ahu maka orịa na-efe efe ebidola ọrụ

Ndị ọrụ ahụike Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara

Mpaghara na ahụ maka ọrịa na-efe efe bu nke akpọrọ 'Nigerian Centre for Disease Control' (NCDC) ekwuola na ha ma maka ọrịa Ebola batara mba Congo, ma na-emekwa ihe ha kwesịrị ịhụ na-egbochiri ya ịbata Naịjirịa.

NCDC kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa na Congo na-akpakọrịta.

Ma kwukwaa na ha ebidola nzukọ maka ya, ịhụ na e kere nkwụcha ọfụma ịhụ na ọ bataghị Naịjirịa.

Cheta n'afọ 2014, onye mba Liberia bụ Patrick sawyer bu Ebola bata Legos wee kesaa ya.

Ndị nwụrụ na ya bụ ọrịa na Naịjirịa bụ mmadụ asatọ, anọ n'ime ha bụ ndị ọrụ ahụike letara Sawyer, ebe ndị ọzọ a kpọpụrụ maka na a na-enyocha ha mechara gbakee.

Congo na onwe ya nwere mgbasa ọrịa Ebola n'afọ 2017. Nke afọ a mere ya ugboro asatọ ha na-enwe ọrịa Ebola na mba ahụ.

Na nke dịkwa ka ya, ndị na-ahu maka mbata na ọpụpụ na Naịjirịa bụ nke akpọrọ Naịjirịa Immigration Service (NIS) ekwuola na ha amalitela nyocha ndị mmadụ n'ọdọ ụgbọelụ na Naịjirịa.

Ndị mmadu na-etinyekwa ọnu n'okwu ọrịa na Twitter.

Otu onye sị ka amachie asọmpi enyi na enyi Naịjirịa na Congo nwere n'ụbochị 28 n'ọnwa a.

Onye ọzọ na-ekwu na ndị ihe metụtara na Congo nwere ike ịbịa Naịjirịa.

Mana gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha dị njikere maka Ebola, ka ndị NCDC na-ekwu na akwụkwọ ha dere n'afo gara aga maka etu ha si kwado maka Ebola ka dịkwa mpa. Guo ya ebe a.

Lee etu ha kwuru ị ga-eji gbochie Ebola:

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a