Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ọdọ mmiri tiwara na mba Kenya egbuola mmadụ 120
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Otu na-ahụ maka ihe gbata gbata bụ Red Cross ekwuola na eburula mmadụ ruru iri atọ n'itoolu gaa ụlọọgwụ mgbe ọdọ mmiri tiwara n'isiobodo Kenya bụ Nairobi.
Ebe foto si, AFP
Ọdọ mmiri ahụ tiwara site n'oke mmiri ozuzo gburu mmadụ otu narị n'iri abụọ 120.
Naịjirịa
Gọọmentị etiti adọọla ngalaba na-ahụ maka ahụike aka na ntị ka ha hie asaa n'anya kwadoo nkeọma maka ọrịa ebola anụrụ na ọ laghachitela na mba Congo.
Ebe foto si, AFP
E kwukwara ka ha jisieke na-echekwa oke Naịjirịa maka i ji gbalahụ ọrịa a.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Onyeisi ndị uweojii na-elekọta ụlọ omeiwu Naịjirịa aha ya bụ CSP Sulu-Gambari Abdul ataala ndị nọ n'ime sineti ụta maka mwakpo e mere n'ụbọchị iri n'asaa nke Epurel.
Ebe foto si, Nigeria Senate/Twitter
Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti
Ọ sị n'ụfọdụ ndị sineti na ndị nchekwa so kpa nkata izu ọfọ n'imeụlọ sineti.
Akụkọ mba ofesi
Ndị mba Amerịka atọ mba Nọt Koria tọghapụrụ ekelela onyeisiala ha bụ Donald Trump nakwa onye odee akwụkwọ mba Amerịka bụ Mike Pompeo maka nwere onwe ha.
Ebe foto si, Reuters/AFP
Trump ekwuola na ihe a na-egosi ihuoma Nọt Koria bu n'obi ma kwu kwa na enwela ụbọchị na ebe ya na Kim Jong un ga-enwe nzụkọ.
N'egwuregwu,
Onye na-achịkọta bụ otu egwuregwu bọọlụ Manchester United bụ Alex Ferguson esila n'ọnọdụ nleta dị ọkụ pụta.
Cheta na a wara ya isi nke gbata gbata maka ọbara na-agba ya n'ụbụrụ n'ụbọchị satọde.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Mkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa