Bọjeetị Naịjirịa ọ ga-apụta n'ọnwa a?

Onyeisiala Buhari Image copyright Nigeria Presidency/Twitter
Nkenke aha onyonyo Onyesisala Buhari nyere ndi omeiwu akwukwọ bọjeetị nke 2018 n'ọnwa Nọvemba nke afọ 2017

Mgbe onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nyere ndị omeiwu Naịjirịa akwụkwọ eji hazie etu a ga-esi mee mkpata na mmefu (bụ nke Bekee kpọrọ "budget") nke afọ 2018 n'ụbọchị asaa nke ọnwa Nọvemba n'afọ gara aga ndị mmadụ chere na ha ga-ewepụta ya tupu a banye ọnwa Jenụwarị nke 2018.

Ọnwa a nọ n'ime ya ugbua bụ Mee, bụ ọnwa nke ise na 2018, mana ndị omeiwu ewepụtabeghị ya bụ bọjeetị.

Ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba na-akọwa na etu o siri kwụrụ ugbua ga-eme ka ọ raa Naịjirịa ahụ, okachasị ebe ometụtara ọganihu obodo.

Ihe mere ihe a jiri ka njọ bụ na amaghị mgbe ndị omeiwu ga-ebinye aka na ya bụ bọjeetị ma nye ya onyeisiala ka ọ mee ya iwu obodo.

Ndị omeiwu sị na ihe mere ha ejibeghi wepụta 'bọjeetị 2018' a bụ maka ngalaba gọọmentị dị icheiche ewetabeghị nkọwa etu ha sị chọọ ime mkpata na mmefu nke ha, n'agbanyeghị na akwụkwọ ndị omeiwu ji nwere nhazi etu ngalaba dị icheiche kwesịrị isi mee ego na 2018.

Mana ngalaba na-ahụ maka nhazi, - nke a na-akpọ Ministry of National Planning n'asụsụ Bekee - kwuru na ihe niile ndị omeiwu kwesịọrị iji hazie bọjeetị dị n'ime akwụkwọ enyere ha.

Ben Akabueze, bụ onyeisi ngalaba na-ahazi mkpata na mmefu kwuru na ihe niile ndi omeiwu chọrọ dị n'akwụkwọ onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ndị omeiwu n'ọnwa Nọvemba nke afọ gara aga.

Mana, ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị omeiwu na-akpọ ndi isi ngalaba dị icheiche ka ha bịa zara ọnụ ha, nke bụ ihe ya ma na emeela.

Ihe ọ pụtara

Ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba obodo na-ekwu na Naịjirịa agaghị ahazi akụnauba obodo ọfụma ma ya bụrụ na bọjeetị a apụtaghị.

Na soshal midia di ka Twitter, ndi mmadụ na-ekwu maka ihe na-eme.

Onye ji akara @AdeBanqie ede na Twitter dere na ndị Naịjirịa kwesiri ikwu na ndị omeiwu agaghị arụnwụ ọrụ n'ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ụlọọrụ na-enyocha etu gọọmentị jiri agbari "budget" bụ BudgIT dere na ọ bu nke afọ a kachasi tee aka kemgbe ebidoro ihe banyere bọjeetị na Naịjirịa.

@OduObodumu na-ajụ ma onwere obodo ọzọ akwụkwọ mkpata na mmefu notegoro aka ruo etu nke afọ a ruru.

@Purrples sị na ya na-akpọ onyeisi ndị omeiwu ukwu ka ọ bịa zara ọnụ ya maka akwụkwọ mkpata na mmefu a.

Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ @ApanpaOlasumbo bụ onye na-ajụ ihe mere ndị Naịjirịa ejighị ekwu okwu maka ihe a na-eme.

Ka ihe ndị na-eme, ndị omeiwu na-ekwu na ha ga-ebinye aka na ya bụ akwukwọ n'ụbọchị 16 nke ọnwa a, mana ọbụghị mbụ ha kwuru etu a, nke mere anyi ji ajụ, "agbu ji agu ọ ga-arapụ ya ugbua?".

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara