'Anyị ji mmiri mmanụ ụgbọala dị esi ihe ma wụọ ahụ'

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption"Anyi jị mmiri mmanu ugbọala asa ahụ"

Ndị bi n'obodo Akoka dị na Legọs na-ebo ọdọ mmanụ ugboala akpọrọ Total, ebubo na ha tinyere ndụ ha na nsogbu.

Ndị bi n'obodo ahụ gwara BBC na mmanụ ụgbọala si n'udu Total liri n'ime ala ehipụ abanye na mmiri ha. Ha sị na ọ bụ mmiri a ka ha ji esi nri ma saa ahụ.

Ndị BBC gbara Aleem Maruf bụ onye na-ahụ maka ọdọ mmanụ ụgbọala Total ajuju ọnụ. Maruf kwuru na Total emeela ihe gọọmentị gwara ha mee maka ndị ihe a metụtara, dị ka inye ha ihe nkasi obi. O kwuru na Total nyere ha udu ọhụrụ ma na-agbanyere ha mmiri kwa ubọchị atọ niile. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọdọ mmanụ ụgbọala ahụ nyekwara ha igwe eji agbapụta mmiri na nke eji asa akwa.

Mana ndị mmadụ kwuru na Total emebeghị ihe ha kwesịrị. Jonathan Iwelu bụ onye bi n'ebe ahụ sị: "Anyị dọọ mmiri, Ị ga-ahụ na ọ gbanweela ọcha ya, na-esi ka mmanụ ụgbọala.

Itinye ya ọkụ, o nwuru ọkụ. Ha kwesịrị inyocha mmiri ka anyị mara ma ọ dịla mma ịṅụ".

Nkenke aha onyonyo Jonathan Iwelu kwuru na mmiri a na-esi ka mmanụ ụgbọala

Enuka Umeike bụ onye ihe a metụtara be ya sị "Total agbaala anyị n'anwụ ka ọrịa dị icheiche dakwasị anyị. Anyị nwere obele ụmụaka ebe a, ha na-aṅụ mmiri a, na-egwu egwu ma na-asa ahụ n'ime ya. Mana ha amaghị na mmiri a nwere ike bunye ha ọrịa.

Ya bụrụ na mba ofesi, Total ga-ahazicha ihe a etu okwesịrị kemgbe. Anyị achọghị ịga ụlọikpe mana anyị agwala gọọmentị.

Nkenke aha onyonyo Enuka Umeike sị na Total etinyela ha na nsogbụ

Ọkammụta Francis Duru bụ onye nkuzi na Mahadum nke Legọs, sị "Ya bụru na mmiri na mmanụ ụgbọala gwọkọọ o nwere ike igbu nwa nọ n'afọ maọbụ nye mmadụ kansa, maọbụ mebie ihe n'ahụ mmadụ".

Nkenke aha onyonyo Ihe dịka Lead, benzene na ndị ọzọ nwere ike imebi akụ ndụ

Okami Okaabi bụ onye na-arụ ọrụ ahụike na nchekwa kwuru na mmiri dị n'ime ala na mmanụ ụgbọala gwọkọọ, ọ ga-ete aka tupu ewepụ ya. O kwuru na Total kwesịrị itinye ebe ndị mmadụ ga na-eme nyocha ahụ ịhụ etu o siri metụta ha makwa kpọga ha ebe ọzọ.

Ụlọọrụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi na Legọs bu "Lagos State Environmental Protection Agency" (LASEPA) ekweghị etinye ọnu na ya bụ okwu. Ha sị ka BBC ga jụọ ndi Total maka ihe ha na-eme banyere ya bu ọdachi.

Ọtụtụ obodo dị na Niger Delta nke ndịda Naịjirịa na-enwe nsogbu sitere na mmanụ agbịdị na-emebi ala ha, mana ọbụghi ihe a na-anụ mgbe niile na mmanụ na-ehi ehi site n'udu eliri n'ala.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a