Akụkọ kachasị n'abalị a: Rooney ọ ga-apụ Everton?

Akụkọ kachasị n'abalị a

Ụlọahịa gọọmentị Anambra kwaturu

Ndị na-arụ ọrụ na gọọmentị Anambra steeti nke kọmishọna na-ahụ maka njem bụ Uchenna Wiper du, kwatusiri ụlọ ahịa dị n'ụzọ Oby Okoli n'Awka taa.

Ha sị na ọ na-egbochi ịgafe n'ụzọ sịrịrị werere. Ha chụpụkwara ndị ọgbatumtum nakwa ndị ọkwọ ụgbọala na-anọ nso ebe ahụ.

Imam anwụọla

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụlọ ekpere ndị alakụba awakporo ma gbuo otu onye na Saụt Afrịka

Onyeisi n'otu ụlọ alakụba anwụọla n'ụlọọgwụ na mba Saụt Afrịka.

Ndị bu egbe na mma wakporo ha n'ụlọ ekpere ha n'obodo Durban, ma bewaa ya olu nke mere ka ọ nwụọ site na ahụ ọ merụrụ.

Mmadụ abụọ ndị ọzọ merụkwara ahụ ka ndị ahụ wakporo ha mechara tụpụ ogbuniigwe eji mmanụ ụgbọala rụọ, nke munyere ọkụ n'ụlọ ahụ.

N'akụkọ mba ofesi,

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Israel nọ na Golan Heights agbadola anya kamgbe abalị Tuusde

Ndị mba Israel kwuru na ha wakporo ngwaagha ndị agha Iran dị n'ime mba Syria.

Ndị Israel sị na ha mere nke a ije megwara ndị Iran gbapụrụ rọketị iri abụọ n'ebe ha nọ na Golan Heights n'abalị.

Wayne Rooney ọ ga-apụ Everton?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Wayne Rooney gbaara Manchester United bọọlụ afọ iri na atọ site n'afọ 2004 ruo 2017 tupu ọ gaa Everton bụ ebe o bidoro ịgba bọọlụ

Onye egwu ndị England bụ Wayne Rooney nwere ike ịhapụ ndị otu Everton na ngwụcha afọ a.

Akụkọ kwuru na Rooney si Manchester United gaghachị Everton n'afọ 2017, ga-ebido ịgbara ndị DC United nke dị na mba Amerịka bọọlụ n'afọ na-abịa.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkịrị taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a