Ntuliaka 2019: Pati ADC ọ ga-emegwara APC ihe ha mere PDP?

Olusegun Obasanjo

N'afọ 2013, otu pati anọ na Naịjirịa kpokoro ọnụ mee otu pati iji kwatuo patị PDP bụ ndị nọ n'ọchịchị oge ahụ.

Pati APC na mbụ na ndụ Naịjirịa kamgbe ndị nkịtị were ọchịchị n'afọ 1999 napụrụ onyeisiala nọ n'ọchịchị ọkwa dịka ha meriri na ntuliaka 2015.

Oge ahụ ka Muhammadu Buhari nara Goodluck Jonathan ọchịchị.

Pati ndị mere APC

Pati anọ bụ ndị mebere otu pati APC n'afọ 2013. Pati ndị ahụ bụ ndị chere na ihe onyeisiala Jonathan na-eme oge ahụadighi ha mma. Pati ndị ahụ bụ:

  • Otu pati Action Congress of Nigeria ACN n'aha ịchafụ nke onyeisi ha bụ Bola Ahmed Tinubu
  • Otu Congress for Democratic Change CPC n'aha ịchafụ bụ otu pati onyeisiala Buhari nọ n'isi ya oge ahụ
  • Otu pati All Nigeria People's Party bụ pati Buhari jiri zọọ ọchịchị n'afọ 2003, onyeisi ya bụ Edwin Ume-Ezeoke
  • Otu All Progressive Grand Alliance nke ụfọdụ n'ime pati ahụ obi na dịghị mma kewara sonyere ndị otu a kpokoro ọnụ.

N'ọnwa Novemba afọ 2013, gọvanọ ise nọ na PDP hapụrụ pati ahụ banye APC ebe ndị sinetọ ruru mmadụ 49 mekwara etu ahụ nke mere APC jiri merie ọchịchị n'afọ 2015.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo PDP chịrị Naịjirịọ́ afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị

Nke na-eme ugbua

Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo dọkara akwụkwọ kaadị gosiri na ọ bụ onye otu pati PDP kwuo na ya anọghịzi n'otu pati ọbụla.

N'ọnwa Jenuwarị afọ a, Obasanjo bidoro otu ọhụrụ nke ọ kpọrọ Coalition for Nigeria Movement CNM n'aha ịchafụ nke o kwuru na ọ bụghị otu pati mana ụnyaahụ, otu ahụ kwupụtara nkwado ha nye otu pati ADC maka ntuliaka 2019.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo APC were ọchịchị n'afọ 2015

Pati ADC a ọ chọrọ ime ihe APC mere na 2013?

APC bụ pati kpokoro pati ndị we merie ọchịchị ma Obasanjo kwuru na ha chọrọ inye ndị APC ọsọ, nke pụtara na ha nwereike ikwatu APC etu APC si kwatuo PDP.

Ụfọdụ ndị gọvanọ nọ n'APC na ekwupụta iwe ha gbasara ọchịchị ndị APC ebe ụfọdụ ndị omeiwu dịka onyeisi ndị sineti na ndị pati APC na-akwata ya kamgbe.

Ọ bụrụ na ndị a iwe na-ewe kpebie ịpụ na APC, ha nwereike laghachi PDP maọbụ banye pati ọhụrụ ahụ ebe Obasanjo nọ nke ga-enye ADC ụdị ikike APC nwere oge nke ya.

Ihe ndị ị na-amaghị maka CNM na pati ADC

Image copyright CNMovement/ Twitter
Nkenke aha onyonyo Ha ji ụdị ihe osise a na-ajụ ụmụ Naịjirịa ajụjụ gbasara etu ngalaba dị icheiche na Naịjirịa si eme
  • Obasanjo kpokobara CNM ebe aka chịburu Ondo steeti bụ Olagunsoye Oyinlola sikwa PDP pụọ bụ onyeisi ha
  • CNM nwere mmadụ karịrị nde atọ debanyerela aha na pati ahụ
  • Ihe ruru pati 68 chọrọ ikpoko ka ha na CNM bụrụ otu
  • CNM akwadola otu pati African Democratic Party nke bụ ADC n'aha ịchafụ
  • ADC bidoro n'afọ 2006, onye zọrọ ha ọchịchị bụ Pat Utomi n'afọ 2007
  • PDP kwuru na ya na ADC na pati ndị ọzọ na-anọghị n'ọchịchị ga-ejikọ aka chụpụ onyeisiala Buhari na ndị APC na 2019.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'APC bụ Bolaji Abdullahi kwuru na-agbanyeghi na CNM na ADC kpokoro, ya mara na ụmụ Naịjirịa ka nwere ntụkwasị obi n'otu ya APC.

Ihe a niile na-eme na-egosi etu ntuliaka 2019 ga-esi gaa na ihe ihuigwe ga-adị ka ya oge ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị: