Otu Rochas Okorocha asaala Toe Ekechi maka ọkụ gbara ụlọọrụ APC

ọkụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ nsogbu pụtara n'ụfọdụ steeti ebe e mere ọgbakọ nke okpuru ọchịchị a n'izu ụka gara aga

Sam Onwuemeodo bụ onye odeakwụkwọ gọvanọ Rochas Okorocha gbasara ndị ntaakụkọ gwara BBC Igbo na ebubo Theodore Ekechi boro Okorocha bụ asị.

O kwuru na ọ bụ ndị otu ndọrọndọrọ PDP bụ ndị gbara ụlọọrụ a ọkụ.

N'ọnụ okwu ya "Rochas bụ onye kwụrụ ụgwọ maka ị zụ ụlọọrụ a, kedu ihe ga-eme ka ọ bụrụ na ya bụ onye gbara ebe a ọkụ?"

Onwuemeodo kwuru na otu PDP nụrụ na APC chọrọ ị me ntụlịaka ịmeụlọ, ihe a mere ka ha bịa mebisie ihe niile.

O bo kwa Ifeanyi Araraume bụ onye nwere olileanya ịgba ọsọ ntụlịaka 2019 dịka gọvanọ Imo steeti ebubo na ya bụ onye ana arụ aka mere ihe a.

Onwuemeodo kwuru: "gọvanọ niile chiburu Imo ka Araraume busoro ọgụ, ọ bụ iwu na ọ ga-abụ govanọ Imo steeti?"

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rochas Okorocha kwuru na onweghị ihe dị njọ na ọchịchị ya

Oge BBC Igbo juru Onwuemeodo ebubo ha na-ebo Okorocha maka ị tinye ọgọ ya n'okwa ọchịchị, Onwuemeodo kwuru na onweghị ihe dị njọ na Okorocha chọrọ ka ọgọ ya ba n'ọkwa ọchịchị.

O kwuru: "na Amerika, oge George Bush chịburu na kwa o nyere nwa ya aka ọ ba kwa n'ọkwa ọchịchị? Gịnị mere nke Rochas ga-adị iche?"

Okwu a malitere oge Theodore Ekechi bụbu kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Imo steeti ekwuola na ọ bụ Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị otu ya mụnyere ụlọọrụ APC ọkụ ụnyaahụ.

Ekechi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ndị Imo jụrụ Rochas Okorocha maka arụ ọ na-eme na steeti ahụ.

O kwuru na nsogbu a niile bidoro mgbe ya na ndị otu ya jụrụ ka gọvanọ webata ọgọ ya nwoke n'ọchịchị Imo steeti.

N'ọnụ ya, "onweghịzi onye kwụnyeere nwoke a maka ihe ọjọ o merela na steeti anyị."

Ihe Ekechi kwuru maka ntuliaka ime ụlọ ha mere

  • Gọvanọ Okorocha ekweteghị na ọ dara na ya bụ ntuliaka.
  • Govanọ Okorocha na-eme ihe ọ bụla iji wee hụ na akagburu ntuliaka ahụ ma megharịa ya.
  • Okorocha kpọchiri ụfọdụ ndị ọrụ ntuliaka ahụ n'ụlọ obibi gọọmentị.
  • O kwuru na gọvanọ ndị Imo steeti nyere iwu ka a gụọ ihe atụtara na ntuliaka a na be ya.
  • O kwuru na ụfọdụ ndị otu APC n'Imo steeti gara nwee nzụkọ na ụlọ osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, ka ha wee gwa ya nke bụ eziokwu maka ihe mere na ntuliaka ahụ.
  • Ha gosi kwara osote onyeisala Osinbajo ihe nkiri gbasara ntuliaka ime ụlọ a.
  • O kwukwara na osote onyeisiala ekweghị ka Rochas bata na ya bụ nzụkọ makana ọ bụghị ya na ya kara izukọ mgbe ahụ.

Cheta na Gọvanọ Okorocha kwuru na ọ bụ makana ezuru ngwongwo eji eme ntuliaka ụbọchị satọde gara aga mere o ji daa na ya bụ ntuliaka.

Kamgbe ahụ ọ na-arịọ ka emegharịa ya.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a