Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ronaldo ọgbakeela?

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Nkọwa foto,

Ọtụtụ nsogbu pụtara n'ụfọdụ steeti ebe e mere ọgbakọ nke okpuru ọchịchị a n'izu ụka gara aga

A ka na-achọ ndị mụnyere isi ụlọọrụ ndị otu pati APC dị n'Imo steeti ọkụ ụnyaahụ.

Hilary Eke bụ onye isioche APC n'Imo na-ekwu na ọ bụ ndị omekome busoro ndị otu ha agha n'izu gara aga, kpara mkpamkpa a.

Nlọta Buhari

Nkọwa foto,

Buhari kwuru na ọ ga-eso n'ọsọ ntuliaka 2019

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na nlọta ya otu ụbọchị tupu oge o kwuru na ọ ga-alọta abụghị maka ihe ọbụla, na ahụ siri ya ike.

Cheta na Buhari kwesịburu ịlọta taa ka ọ gara UK ime nyocha maka ahụike ya.

N'akụkọ mba ofesi

Nkọwa foto,

Najib Razak na nwunye ya bụ Rosmah Mansor nọ na-akwado ịga mba ofesi maka ezumiike tupu amachie ha

Amachiela onye bụbu Praịm minista ndị Malaysia bụ Najib Razak na nwunye ya ịpụ obodo ha.

Ọ kwesịrị ịzara ọnụ ya maka ebubo eboro ya gbasara imefu nde dọla narị asaa oge ọ nọ n'ọchịchị n'afọ 2015.

N'Egwuregwu

Nkọwa foto,

Real Madrid meriri otu Bayern Munich iji garuo agba ngwụcha Champions League

Onye egwu ndị Real Madrid bụ Cristiano Ronaldo alọghachịla ma bido ọzụzụ egwuregwu ọzọ.

Cheta na Ronaldo rọjiri ụkwụ ka ha na ndị Barcelona zukọrọ n'ụbọchị ụka mere ka ụfọdụ na-atụ egwu ma ọ ga-agbake tupu ha na Liverpool ezukọọ na ngwụcha Champions League n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa a.

Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a: