SERAP akpụpụla gọọmenti UN maka ịjụ mkpebi ụlọikpe

Ikpe nkwụmọtọ Image copyright Uche Akolisa
Nkenke aha onyonyo SERAP : "Oke nnupụ isi na mkpebi ụlọikpe megidere nkwụsị ike nke iwu ala anyị na nkwuruonwe nke ngalaba na-ahụ maka ikpe

Otu na-agba mbọ maka ikike dịrị mmadụ nke a kpọrọ SERAP n'aha ịchafụ edegara otu mba ụwa bụ United Nations(UN), iji rịọ ka ha manye ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ kwụsị oke inupụ isi na mkpebi nke ụlọikpe.

SERAP(Socio-Economic Rights and Accountability Project) bụ Timothy Adewale degara onyeisi otu UN na-ahụ maka nkwụrụonwe ndị ọkaikpe na ndị ọkaiwu bụ Diego García-Sayán akwụkwọ mkpesa.

N'ime ya, SERAP tiri mkpu na "ị gee ntị na naanị mkpebi ụlọikpe masịrị ga weta nnukwu nsogbu na ihe gbara nsonye ihe iwu kwuru n'ala Naijiria ma ọ bụrụ na o nweghị ihe e mere maka ya".

SERAP kwuru na : "Oke nnupụ isi na mkpebi ụlọikpe megidere nkwụsị ike nke iwu ala anyị na nkwuruonwe nke ngalaba na-ahụ maka ikpe".

Ha sịkwa na ọ bụrụ na o nweghị ihe e mere maka nke a ngwangwa, ọ ga-eme ka onye ọbụla zọwa isi onwe ya ma bido inupụwara ndị ọchịchị obodo isi dịka o siri gbasaa ịchụpụ mpụ na mmerụaka.

"Ichekwa nkwụrụonwe nke ngalaba na-ahụ maka ikpe bụ isi okwu, ọ bụghị okwu onye ọ gbasara."

SERAP boro gọọmentị ala Naijiria ebubo na ha nupụrụ isi na mkpebi ụlọikpe nyere n'ikpe gbasara; onyeisi otu ndị ụka alakụba bụ Ibrahim El-Zakzaky na nwunye ya; onye bụbu onye ndụmọdụ gọọmenti etiti n'ihe gbasara nchekwa bụ Sambo Dasuki (rtd); nakwa otu SERAP.

SERAP sị, "Gọọmentị Naijiria nupụrụisi na opekata mpe mkpebi abụọ nke SERAP nwetara n'ụlọikpe ukwu nke etiti (Federal High Court.)

"Nke mbụ bụ ikpe nke akara ya bụ FHC/IKJ/CS/248/2011 nke Jọstis Mohammed Idris kpebiri n' ọnwa Maachi afọ 2016 ebe o nyere gọọmenti etiti iwu ka o depụtara ọha ngụkọ etu e siri rie ego niile e nwetaghachiri site n'aka gọọmenti ndị chịrị kemgbe 1999.

"Ngụkọ ahụ nke ụlọikpe nyere iwu ya gụnyere; ego niile gọọmenti nwetarala site n' ego ala anyị e zuru ezu; ego ole e riela n'ime ego ndị ahụ e nwetaghachiri."

"Mkpebi nke abụọ bụ ikpe akara ya bụ FHC/CS/964/2016 nke Jọstis Hadiza Rabiu Shagari nyere na ọnwa Julai, afọ 2017 ebe o nyere gọọmenti iwu ka ha gwa ndị Naijiria ọnọdụ e jiri nwetaghachi ihe ndị e zuru ezu nakwa ego ole e nwetara n'aka onye ọrụ gọọmenti ọbụla.

"Mana, ndị isi ọchịchị Naijiria haara ige ntị na naanị ụfọdụ mkpebi ụlọikpe.

"Ha agbagharịkwaghị akwụkwọ mkpegharị na akwụkwọ ndị a a gbara ha."

SERAP tụkwara arịrị na gọọmenti steeti ụfọdụ na-enupụkwa isi na ihe ụlọikpe kwuru na eleghị anya n'azụ.

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a